Agaghị m agbatu n'ọkwa ọchịchị

Eboro Zuma ebubo mpụ na nrụrụaka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Eboro Zuma ebubo mpụ na nrụrụaka

Onyeisiala mba South Africa nọ na nsogbu ugbu a bụ Jacob Zuma ekwuola na o nweghi ihe ọjọọ ya mere nke a ga-eji asị ya gbatuo n'ọkwa ọchịchị.

Zuma kwuru nke a mgbe ndị pati ya bụ African National Congress (ANC) nyere ya iwu ka ọ gbatuo n'ọchịchị maọbụ achụpụ ya n'ike echi.

Onye a agbara afọ 75 bịara n'ọnọdụ ịkwanye ọkụ n'ike ka ọ gbatuo maka ọtụtụ ebubo mpụ.

Mana ọ kwuru na ndị ANC ekweghi agwa ya ihe mere ejiri akpọghachị ya.

Mgbe ọ zara ajụjụ ọnụ n'ụlọ mgbasa ozi ndị mba Saụt Afịrịka bụ SABC, Zuma ekwughi okwu maka mwakpo ndị uweojii wakporo ụlọ ezigbo enyi ya nwoke nke ezinụlọ ndị Gupta nke India.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Akpọchiri ụlọ ndị Guptia mgbe ndị uweojii wakporo ha.

Eboro ndị Guptia ebubo iji ohere enyi ha na onyeisiala kọrọ ezigbo ohere n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ha gọnarịrị ebubo a.

Zuma kwuru na onweghi iwu ndị ANC ọ dara mana okwenyeghi na mgbatu n'ọkwa asịrị ya gbatuo.

"Ihe ha na-eme m adịghị mma, onwebeghi onye gwara m ihe ọjọọ m mere." dịka o kwuru.

Zuma gwara ndị SABC na o kwetala ịgbatu n'ọnwa Juunu. Ma katọọ otu ha ji emegide ya.

Ndị otu ANC kwuru na ha-ahụla ihe Zuma kwuru na TV mana ha na-eche ihe ọ ga-ekwu dịka o kwere na nkwa.