Jacob Zuma etinyela akwụkwọ arụkwaghịm

Jacob Zuba Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E boro Zuma ọtụtụ ebubo mmerụaka

N'ozi oziri nke a gbasara n'onyonyo televishon, o kwuru na ya na-arịtu mana o kweghị n' okwu otu pati ya bụ ANC.

Ndị ANC gwara ya ka ọ rịtuo ,o meghị otu ahụ, ha ga-ewepụ ya site n'ụlọ omeiwu.

Ọtụtụ akpọla oku ka nwa amadi a dị afọ iri asaa na ise rituo, ma nye ohere ka osote ya bụ Cyril Ramaphosa, bụrụ onye ndu ANC.

E boro Zuma, onye banyere ọchịchị kemgbe afọ 2009, ọtụtụ ebubo mmerụaka.

Ụbọchị Wenezde, ndị uweojii wakporo ụlọ ndị ezinaụlọ ama ama ma nwekwa ego bụ Gupta ndị ya na Zuma nwere ezigbo mmekọ n'ụlọ ha dị na Johannesburg.