E mela Ramaposa onyeisiala mba South Africa

Cyril Ramaphosa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Cyril Ramaphosa bụbu osote onyeisiala mba South-Africa

Onyeisiala ọhụrụ ahụ bụ sọ otu onye akpọlitere maka ọkwa ahụ n'ụlọ omeiwu a ma jiri ukwe na ọṅụ nabata ya n'ụbọchị Tuesday.

Bolaji Akinyemi , onye bụbu Mịnịsta Naijiria na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ ekwuola na aka mgba na-eche Ramaphosa bụ onye nọchiri anya Zuma nke South Africa.

Akinyemi bụkwa onye ọkammụta n'ihe gbasara ihe na-eme na mba ndị ọzọ kwuru na ọ dị ọtụtụ olulu ga-echere Cyril Ramaphosa aka mgba dịka ọ na-abanye n'ọkwa onyeisiala.

Na mkparịtaụka ya na onye ntakụkọ BBC, Akinyemi kwuru na ntuliaka ememe ikpeazụ na mba South-Africa ebe Ramaphosa jiri obere ihe were merie, kewara ANC ebe ọ dị ukwuu.

Akinyemi sịrị na-etu o siri dozie esemokwu dị na ANC ma kpa udo ga-ekwu ma ọ ga-eme nke ọma.

O kwukwara na e nwere ọtụtụ ndị nwere agba nọ na otu pati ANC na ndị anọghị ya bụ ndị eboro ha na Zuma ebubo mmerụaka bụ ndị nwere ike ichere ya aka mgba.

Ọzọ dịka ibe, Akinyemi kwuru na Ramaphosa bu ebubo dị icheiche bata n'ọkwa ọhụrụ a nke gụnyere ebubo mmerụaka na igbu igbuọtụtụ ndị mmadụ na Marikari.

" Africa agaghị enwelata mụọma dịka onye ndụ. ọ bụ ka ọsị hazie aha ya n'ọchịchị ga ekwu ma ọ ga-achị nke ọma."

"Ọzọ bụ akụnaụba nke mba ahụ. nke nwere enweghị ọrụ ruru pacent iri abụọ na ise."