Ịzọ Igwe Ojoto: 'Ihe mere m ji were iwe pụọ na nzukọ gọọmenti'

Okpueze Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na azọ onye ga-abụ eze ndị Ojoto

Nsogbu dapụtara mgbe Okafor jiri iwe pụọ na nzukọ otu nke Govanọ Willie Obianop họputara ka ha lebanye anya na nhọpụta onye ga bụ Igwe Ojoto.

Okafor boro gọọmenti ebubo na ọ na-akpa nkata imebi iwu imee eze nke obodo ahụ.

N'ozi o wepụtara, kwuru na ndị umu nna Umuofor na Enugu-Ojoto họpụtara ya ma che ya n'ihu Ojoto Akanasato dika Igwe elect.

Mana,dịka o siri kwu, nsogbu karịrị mgbe gọọmenti jiri bata idozi okwu pụtaranụ, tinyewa aka na ime họpụta ọhụrụ.

Okafor, onye katọrọ nke a kwuru na, "Ịhopụta onye ga-achi obodo bụ ọrụ dịrị ndị nwafọ ọjoto. ọ bụghị ọrụ dịrị gọọment ị hịọ onye ga-achị obodo'."

O boro ndị nọ n'otu nhazi nke gọọment ahụ ebubo na ihe ha eme na-eme edoghị anya nke mere ya jiri degara gọọmenti akwụkwọ.

Mana onye isi otu nhazi esemokwu ahu mabụrụkwa Mịnịsta na-ahụ maka ahụike.

Nsogbu ịzọ onye ga-abụ Igwe dapụtara na obodo Ojoto dị n'Anambra State.

Ihe kpata ụka

Akụkọ BBC nwetara kwuru na nsogbu a nke bidoro kemgbe otu afọ, dị n'etiti ndị Ojoto Ụnọ na Ọjọtọ Obiọfịa.

Ọtụ onye Ojoto, Oriakụ C Okafor, gwara onye ntaakụkọ BBC na n'ọ bụ ndị Ojoto Obiọfịa ka ịbụ Igwe ruru.