INEC: Ugwu Awụsa kacha n'ọnụọgụgụ ndị tinyere aha maka ntuliaka

Ndị ọrụ INEC ebe ha na-edenye aha ndị mmadụ. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Naịjiria na akwado ime ntụliaka n'afọ 2019

Ka Naịjiria na-akwado ibido ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nke afọ 2019,ngalaba na-ahụ maka ntuliaka aka bụ INEC ewepụtala ọtụtụ ọnụọgụgụ.

Ọnụọgụgụ nke a gosiri na mpaghara ugwu Naịjiria nwe karịchara ndị mmadụ denyere aha n'akwụkwọ ntuliaka.

Ndị na-esokwa ha n'azụ bụ steeti ndị nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ mana ndị nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ nọ n'ịkpeazụ.

INEC kwukwara na ndị anatabeghị akwụkwọ nke eji ga-eme ntụliaka ka nkụ. Sọsọ na Lagos, ka ha ruru mmadụ otu nde na ọkara.

Ka ọnụọgụgụ sị kwụrụ

Image copyright AFP
  • 18,505,984 - ndị denyere aha ntụliaka na mpaghara ugwu Naịjiria
  • 14,626,800 - ndị denyere aha ntụliaka na mpaghara ndịda anyanwu Naịjiria
  • 8,293,093 - ndị denyere aha ntuliaka na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjiria
  • 73,944,312 - Ọnụọgụgụ ndị niile denyere aha ntuliaka na Naịjiria

E leba anya na ndị denyere aha na steetị dị ịcheịche, Lagos bu ụzọ, Kano n'eso ya na-azụ, Bayelsa burukwa ikpeazụ.

INEC kwukwara na ha ga-akwụsị ndenye aha nke a ma o rue ụbọchị iri isii tụpụ ntụliaka ebido.

Solomon Soyebi onye n'ahụ maka ndị ntụliaka na INEC sị na nke a pụtara maka iwu ntuliaka ọhụrụ etinyere.