FA CUP: Iheanacho, Moses, Hazzard, Morata chọrọ ịkwụsị ike

Kelechi Iheanacho Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kelechi Iheanacho ba Leicester n'ọnwa Ọgọsụtụ n'afọ 2017

Ọgbọ egwuregwu bọọlụ ga-ekpo ọkụ n'asọmpị iko FA taa.

Kelechi Iheanacho bụ onye otu Leicester City bụ onye anya ga-atụkwasị n'asọmpị Leicester City na Sheffield United.

Ugbua, Iheanacho enyela ọkpụ anọ n'asọmpị FA n'afọ nke a.

N'izuụka gara aga, Manchester City merịrị Leicester city. Ihe a mere ka asọmpị nke taa dị Leicester City ezigbo mkpa.

Ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya nwere olileanya na Leicester ga-eji asọmpị nke taa nwe kpanite obi ha maka mmerị ha mmerị ha ụnyahụ.

Chelsea ga-at Hull City aka n'anya

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Victor Moses bidoro egwuregwu bọọlụ na Crystal Palace

Gụ kwa Oliseh na Fortuna Sittard agbasala

Chelsea na Hull City ga-ebido mgba nke ha na nkeji itoolu nke abalị n'asọmpị FA.

Moses na Hazzard ga-esokwa na asọmpị taa. Mana Morata sị ezumike mmekaahụ lọta ka anya ga-atụkwasị na asọmpi a.

Antonio Conte bụ onye nkwuzị Chelsea ekwuola n'iko FA dịrị ha ezigbo mkpa. O kwuru na ọ bụghị sọọsọ iko Premier League, mọọbụ Champions League ka ha chọrọ.

Asọmpị ndị garaaga

Arsene Wenger na-ekele ndị otu ha bụ Arsenal maka mmerị ha meriri Ostersunds FK ụnyaahụ.

Ha nyere ha ọkpụ anọ mana ha asatara otu.

Wenger kwuru na mmeri nke a tọrọ ezigbo ụtọ maka na ọnọdụ yabụ asọmpị bụ UEFA Europa League fịara ahụ.

Nacho Monreal bụ onye nyere goolu nke mbu, Sotirios Papagiannopoulos nyere nke abụọ, ebe Mesut Ozil nyere nke atọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara