Ndi uwe ojii: Oke bụrụ ọgwụike a furuefu

Oke Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oke ọ ga-agọpụli onwe ya na ebubo a?

Ka ọ dị be oke, ka ọdị be ọgịnị. N'obodo Kwale nke mba Kenya, ndị uweojii atọ boro oke na ọ kpụrụ ọgwụike akpọrọ 'Bhang 540' nari ise na iri anọ nke e dokwara n'ogige ha maka iji mee ihe akaebe n'ụlọikpe.

Ndị uweojii atọ aha ha bụ Inspetọ Ken Olonde, onye bụ onye nchọpụta, AP Inspectọ Patrick Baya na Sagent Hamisi Komboaha bụ ndị akaebe n'ikpe ụmụnwaanyị anọ e jidere maka ibu ọgwụike ruru 1,710 site n'obodo Migori ga Ukunda nke dị na Kwale. Ndị uweojii a bụ ndị nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a.

Mgbe ọ na agba ndị uweojii a ajụjụọnụ, onye ọkaiwu nọchitere otu na ndị eboro ebubo bụ Abdull Aminga jụrụ ndị uweojii ahụ ka ha kọwaa ihe mere na agba ọgwuike ahụ fọrọ sọọsọ 1,170.

Gu kwa A kwụsịla onye JAMB boro agwọ ebubọ ọrụ n'ike

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLekwa agwọ loro nde naira 36

Ndị uweojii ahụ kwuru na oke banyere n'oge ndị uweojii Kwale ebe e dotere agba ndị ahụ ma taa ha.

Mana ihe gbakwojuru ndị biara n'ụlọikpe ahụ nke onye Okaikpe Paul Mutai nọ n'isi ya bụ na onweghị ogehre dị na igbe anọ ahụ ebe ọgwụike ahụ dị.

Ọ bụ n'ọnwa Julai afọ garaaga ka ha nyụchiri Pauline Moraa, Elizabeth Atieno, Nancy Auma, na Mercy Achieng.

Isiokwu Ndị Emetụtara