A gwala Gọọmenti Naịjirịa ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu na-achọ mnwereonwe bụ Indigenous People of Biafra (Ipob).
Isi ụlọọrụ nchekwa ala Naịjirịa kwupụtara na Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo nnupụisi megide Naịjirịa na-efu efu n'ọnwa Seputemba afọ 2017.
N'ajụjụọnụ pụrụ iche ndị ntaakụkọ BBC Igbo gbara nwunye ya bụ Uchechi Kanu, O boro Gọọmenti Naịjirịa ebubo na ha mara ebe di ya nọ.
Agbanyeghị na ndị agha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị ha ji Nnamdi Kanu.
- Nwunye Kanụ na-arọ nrọ - Lai Mohammed
- Buharị ọ ga-eteta n'ụra ugbua?
- Onweghị ihe gosiri na ọ bụ ndị agha ji Kanụ- Ụlọ-Ikpe