Massob: Gaanụ tinye aha unu n'akwụkwọ ntuliaka

Eastern Nigeria Map

N'akwụkwọ ozi nke Ugwuoke Ibem Ugwuoke, onye odeakwụkwọ nke otu Massob binyere aka, ha kwuru ka ndị otu ha niile nọ n'ala Naịjirịa gbaa mbọ ga-tinye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ma nweta Permanent Voters Card n'ebe ndị INEC wepụtara maka ndebanye aha ka a ghara inwe mgaramara.

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị: "Akwụkwọ ntụliaka Naịjirịa abụghị sọọsọ maka mbinyeakanakwụkwọ nke Naijiria, mana ọ ga-abụ ihe a ga-eji tinye aka ime ntuliaka referendụm maka nwereonwe Biafra."

Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na erubeghị isi na idebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka bụ mmadụ iji aka ya merụọ onwe ya ahụ nke nwere ike imebi mbọ inweta mnwereonwe Biafra.

"Maka inweta Biafra nke United Nations ga-akwado, ọ bụ ndị tinyere aha ha maka ntuliaka na Naijiria."

Ihe mmụta si na census gara aga

Na nkọwa ya, onye mgbasa ozi Massob bụ Comrade Edeson Samuel gwara onye ntaakụkọ BBC sị: "Anyị matara na voters card dị mkpa nye onye ọbula bụ Biafra n'ihi na ọ bụ sọ onye nwere ya ga esonye ime referadum maka Biafra.

Image copyright Getty Images

Comrade Samuel dọrọ ndị Igbo aka na nti ka ha gba mbọ hụ n'ụkwụ ha zọhiere oge gara aga, mgbe ha juru itinye aha ha maka ịnata akwụkwọ ntuliaka na isonye na ọnụọgụgụ nke a kpọrọ census na bekee, ọzọ. Ọ sịrị na agwa ahụ mechara ghọọ mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya.

"Ihe ndị a mere ka ndị Igbo pekarịa n'ọnụọgụgụ, ebe anyị ma na ọnụọgụgụ ndị Igbo karịrị."

Cheta na ụnyaahụ na INEC kwuru na ndị si n'ọwụwa anyanwụ so na ndị pekarịchara mpe na ndị tinyegoro aha ha n'akwụkwọ ha.