Massob ekwuola na ha achọghị uweojii nke steeti

Flagi Biafra Image copyright Getty Images

Otu na-agba mbọ maka iweta mba Biafra a na-akpọ Massob sị na ha ekweghị na mkpebi ndị kọmitee Pati na-achị, họpụtara maka ihe nyocha etu a ga-esi chịa Naịjirịa.

Ndị kọmitee ahụ sị na ikepụta uweojii nke steeti bụ ihe kwesịrị ka eme, mana Massob sị na ha achọghi ya, na ihe ha chọrọ bụ ka ekwea Naịjirịa ka ha wete Mba ha si na ha ga-akpọ Biafra na mba ise ndị ọzọ.

Ndi Massob sị na etu esi egbu ndị mmadụ n'ebe dị icheiche na Naịjirịa gosiri na ịwepụta uweojii nke steetị bụ igbu oge.

Onyeisi mgbasaozi na Massob bụ Sunday Okereafor kwuru nkea mgbe ya na ụlọ ntaakụkọ Punch nwere mkparịta ụka.

Okereafor sị na Biafra dị njikere ikewapụ, ndị dịka Odua, Arewa na ndị ọzọ kwesiri ị na-akwado i nọrọ onwe ha.

Ọ tụrụ aka na ogbugbu mmadụ dị icheiche na-eme na Naijirịa wee sị na ndị United Nations kwesịrị itinye aka hụ na ekepụtara mba isii site na Naịjirịa.

"Anyị sị mba maka uweojii steeti: anyị chọrọ Biafra maka ekwesịrị ikewa Naịjirịa ka enweta mba isii maka nchekwa Naịjirịa abụghị ihe uweojii steeti ga-arụ," Okereafor kwuru.

Onye Massob a gara n'ihu sị na ọ tụrụ ya n'anya etu ndị Naịjirịa nọ na-ekwu okwu banyere mbinyeaka a ga-eme n'afọ 2019 ebe ndị ọchịehi nọ na-egbu ndị mmadụ n'obodo.

Ọ dọkwara ndị na achị steeti dị icheiche n'ọwụwa anyanwụ aka na ntị sị ha ekwekwala ewepụta ala ebe ndị ọchịehi ga-anọ.