Lai Mohammed: Anyị amaghị ebe Kanu nọ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ

Lai Mohammed gọrọ ebubo nwunye Nnamdi Kanu onye ndu ndị Ipob boro sị na gọọmenti etiti Naịjirịa bụ ndị ji di ya.

Na mkparịtaụka ya na onyeisi BBC Igbo nwere n'ekwenti, Mohammed kwuru na ọ bụ nanị nwunye Nnamdi kanu ma ebe di ya nọ.

N'ọsịsa ebubo na ọ bụ gọọmenti etiti ji di ya, Mohammed kwuru, " Ọ na-arọ nrọ. N'ezie, ebubo ya achịtaghị aja."

N'ebubo a, nwunye Nnamdi Kanu kwuru sị na Mohammed kwuru na foto gosiri ebe ndị agha jiri egbe gbawachaa aja ụlọ Kanu oge ha gbara Egwu Eke.

"Onweghị mgbe m kwuru okwu ọbụla banyere Egwu Eke."

Nkenke aha onyonyo Lai Mohammed kwuru na ya nwunye Kanụ ekwubeghị okwu mbụ

Mgbe a jụrụ ya ebe o chere na Nnamdị Kanu nọ, ọ zara sị, "Onye ga-agwanwu anyị ebe ọ nọ bụ nwunye ya."

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, nwunye Nnamdị Kanu kwuru na kemgbe eji mecha 'Egwu Eke,' na ya ahụbeghị di ya maọbụ nụ olu ya. Ọ gara n'ihu kwuo na Lai Mohammed ma ebe di ya nọ.

Ma Lai Mohammed gọrọ aka ya na ụkwụ ya sị: "A maghị m nwanyi ahụ. Mụ na ya akpabeghị nkata mbụ.

"Ebubo ya niile achịtaghị aja. Ọbụghị m ga-asa ajụjụ ndị a ị na-ajụ m. Jụọ Attorney-General."

Gee ihe o kwuru n'uju:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKanu:Ihe Lai Mohammed kwuru