Atịtị egbuola ihe ruru mmadụ 17 na Mozambique

Atịtị dagidere ụlọ ndị mmadụ na Mozambique Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ gọọmentị kwuru sị na ahụbeghị ọtụtụ ndị bi ebe ahụ ịma ma ha adị ndụ

Ihe ruru mmadụ 17 anwụọla n'isi obodo Maputo dị na Mozambique, ka nnukwu atịtị dagidere ụlọ ha.

Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ merụrụkwara ahụ oge ikpo atịtị a, ụfọdụ hacha mita 15, bidoro ịda oge nnukwu mmiri ozuzo bidoro izo n'isi ụtụtụ taa bụ Febrụwarị 19.

Ndị ọrụ mgbapụta ka na-achọ ma onwere ndị ka tọrọ n'okpuru atịtị a.

Ndị obodo Maputo hụrụ nnukwu mmiri ozuzo kemgbe ụnyaahụ, nke mebichara ụlọ ma gbazuchaa ide n'ụzọ.

Ọtụtụ ngwongwo ndị mmadụ mebichara n'ihe mberede a mere ka ndị mmadụ na-arahụ ụra na Hulene, Maputo, bụ otu n'ime obodo kacha daa ogbenye.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ mgbapụta na-abọkasị atịtị ịma ma onwere ndị dị ndụ ha ga-ahụ

Ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ gbatagbata bụ Leonilde Pelembe dọrọ aka na ntị sị na ụfọdụ ndị mmadụ nwere ike ịka nọrọ n'okpuru atịtị a.

O kwuru sị, "akụkọ anyị nwetara n'aka ndị ọrụ gọọmentị ime obodo ahụ bụ na ọnụọgụgụ ndị bi n'ụlọ a ihe a mere karịrị ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ edere ede.

Ndị ntaakụkọ Reuters kwuru sị na ndị ọrụ gọọmentị sị na ha agwabuola ndị bi ebe ahụ kwapụ maka na ha bi n'ụlọ ndị iwu machiri.

Mana otu onye bi ebe ahụ nwa ya nwoke so na ndị merụrụ ahụ a kpọrọ Maria Huo, kwuru sị " E bi m n'agbataobi a maka na enweghị m ebe ọzọ m ga-aga. Ọ bụrụ na ndị gọọmentị gwara m gaa biri ebe ọzọ, a gaara m apụ ebe a."

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a