2019: 'Ndị otimkpu Madumere na nke Nwosu etiela ọkpọ'

Rochas

Ebe foto si, Rochas Okorocha/Facebook

Nkọwa foto,

Rochas Okorocha wepụtara ụlọọrụ na ahụ maka aṅụri nke nwanne ya nwaanyị bụ onye ndu.

Akụko n'eru anyi ntị na-akọwa na ndị mmadụ merụrụ ahụ ụnyaahụ mgbe ndị a na-eche na ha bu ndị otimkpu osote Gọvanọ Imo Steeti bụ Eze Madumere na nke ọgọ nwoke Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Uche Nwosu malitere ịlụ ọgọ na nzụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị emere na Mbaitoli.

Nke a mere n'ụlọ nzụkọ obodo Mbaitoli ebe ndị nso Nwosu gara ị nye ya nkwado maka ị zọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2019.

Otu onye mbaitoli nọ na nzụkọ ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ndị otu nke Nwosu a na-akpọ 'I Believe' n'olu bekee zigara ha ozi nzụkọ, na-agwaghị ha ịhe ga-eme na ya bụ nzụkọ a.

Ọ sị kwara na iwe were ha mgbe ha ruru ebe ahụ, ndị ọbịa ekwuo na ọ bụ nkwadọ Nwosu ka ha bịara ime. Ndị nọ na obodo ahụ hụrụ nke a ka mkparị maka Madumere si ebe ahụ.

Rochas kwuru n'izu ụka gara aga na ọ ga kwado ọgọ ya nwoke bụ Nwosu ma ọ pụta ịzọ ọchịchị afọ 2019.

Aha onyonyo,

Imo Steeti: A zọwala ọkwa ọche Gọvanọr?

Onye nọ ebe ịhe mere kwuru na ndị Mbaitoli jụrụ isonye na nkwado Nwosu, ka ndị ọzọ ebido tiwe mkpu "anyị kwadoro Uche Nwosu", ya mere ọgụ wee bido.

Ọ sị na ndị otu Nwosu ji ihe dị ịcheịche we wakpo ha n'ebe ahụ, kwuo na ndị otu Nwosu akwanyeghị ha ugwu na ihe a ha mere.

BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ ndị ihe metụtara mana ha azabeghị anyị mbe akụkọ a pụrụ.

Mana, onye na ekwu maka ọganiru Imo Steetị na ihe ozi ọhụru a na-akpọ 'social media' n'asụsụ Bekee bụ Jones FCC Onwuasoanya gwara BBC Igbo na onweghị ọgu a nụrụ na nzukọ a.

Mana, ọ gara n'iru si na onwere ndị ha eche na ha bu ndị kwenyere na Madumere bịara ebe nzukọ a bia ịyasa ya. Ọ sirir na Uche Nwosu amaghi maka nzukọ a maka o were ọtụtụ otu na akwado ka ọbụrụ Gọvanọ.

Onwuasoanya zitere anyị foto o sị si na nzukọ a.

Ndi Mbaitoli

Ebe foto si, FCC Onwusoanya

Nkọwa foto,

Ndị bịara nzukọ na Mbaitoli