Ọkpa-ọchị: Ihe ise ị maghị maka Emmanuella

Nwata nwanyị bụ Emmanuella Samuel bụ onye a ga-eji maatụ ilu sị na 'nwata kwọ aka, o soro okenye rie nri'.

Akụkọ n'ekwụ na ọ banyere ihe onyonyo ndị Walt Disney na Hollywood. Ọ sị na-ịme ihe na-akpa ọchị n'onyonyo we rue ebe ahụ.

Ka ude ya n'ede, anyị ga-ewetara gị ịhe ise ị maghị maka nwata nwanyị a pụrụ ịche.

Amụrụ ya n'afọ 2010

Emmanuella bụ nwa afọ Imo steetị amụrụ n'bodo PortHacourt na Rivers steeti:

Image copyright @markangelcomedy
Nkenke aha onyonyo O nwere ihe karịrị mmadụ otu nde na-elele ihe onyonyo ya

Ọ ga-agba afọ asatọ n'ọnwa Julai:

N'agbanyeghị afọ ya, o ritela ntuliugo asaa maka ime ihe na-akpa ọchị.

Image copyright @markangelcomedy
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ nwata na-emepụta ihe ọchị

Nwanne ya nwoke bụ onye akpaọchị amaama:

Ọ bụ n'elu ọkwa nwanne ya bụ 'Mark Angel Comedy' ka o si bido ịmepụta ịhe ọchị nke ya.

Image copyright @markangelcomedy
Nkenke aha onyonyo Nwata nwanyị ahụ na nwanne ya nwoke bụ Mark Angel

O ritela ezigbo ego!

Akụkọ kwuru na Emmanuella eritela ego ruru nde naira iri abụọ n'ise.

Image copyright @OfficialEmanuella
Nkenke aha onyonyo Nwata kwọ aka, o soro okenye rịe nrị

Ihe onyonyo njiri mara ya bụ 'My Real Face'

Lee kwa ya eba:

Onyeịsị ụlọ omeiwu Sinetị bụ Bukola Saraki ezịgara la ya ozi ya bịa n'ụlọọrụ Sineti nara nkwanye ugwu.

Isiokwu Ndị Emetụtara