Ọkaiwu Binta Nyako Adọtịala ikpe ndị Ipob

Ndị Ipob Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Ipob na-achọ ka ekwa Naịjirịa

N'ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja, ọkaiwu Binta Nyako dọtiri ikpe ndị otu Ipob ebidoro kamgbe 2015.

Akụkọ sitere n'aka Emma Powerful bụ onye na-ekwuchitere ndị Ipob na-akọwa na ọ bụ onye ọkaikpe sinetọ na-anọchite anya ndị Abia Saụt Sinetọrịal bụ Enyinnaya Abaribe, tinyere akwụkwọ ka-adọtia ikpe a.

Mana onye ntaakụkọ nọ n'ụlọikpe a gwara BBC Igbo na ọ bụ ọkaikpe nke gọọmenti Naịjirịa sị ka ọkaiwu Nyako wepu okwu Nnamdi Kanu site n'ime nke ndị otu ya.

Onye ntaakụkọ gwara anyị na ọkaiwu kwetere, wee dọtịa ikpe a, weruo ya ụbọchi 20 na 22 n'onwa Maachị nke afọ a.

Cheta na Benjamin Madubugwu, David Nwawuisi, Bright Chimezie Ishinwa, Chidiebere Onwudiwe na ndị ọzọ na-aza azịza maka ebubo gọọmenti Naịjirịa boro ha maka nkewa ha sị ka-ekewa Naịjirịa wee nye ha mba Biafra.

Powerful na-atụ aka na ọ bụ gọọmentị Naịjirịa mere ihe e ji dọtịa ikpe a, ma na a na-asị na ọ bụ ha mere ka Sinetọ Abaribe chọọ ndọtị ikpe a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: