Unicef ekwuola na Naịjirịa bụ 11 n'ụwa n'ọnwụ ụmụaka

Nwatakịrị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Unicef kwuru sị na ihe ruru ọkara ụmụaka amụrụ n'ime afọ ọhụrụ a ga-anwụ

Ndị otu United Nations Children Fund (Unicef), wepụtara akwụkwọ gosiri na Naịjịrịa nọ n'ọkwa 11 gbasara ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ, n'ụwa.

Ha kwuru na ụmụaka iri abụọ na itoolu na-anwụ n'ime otu puku amụrụ ọhụrụ na Naịjirịa kwa mgbe.

Ụfọdụ ihe ndị na-eme ka nwa amụrụ ọhụrụ nwụọ bụ ụbịam, ajọọ nlekọta n'ụlọọgwụ na agha.

Akụkọ ahụ gosiri na ọnụọgụgụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ nwụrụ na Naịjirịa ebelatala mana a ka ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na ha chọrọ imezu ihe ha kpọrọ Sustainable Development Goals.

Unicef kwukwara na mpaghara sub-saharan Afịrịka bụ ndị asatọ n'ime iri ebe ndị jọrọ njọ nne nwere ike ịmụ nwa ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: