Uweojii nke steeti: Buru ụzọ dozie uweojii nke fedralụ

Uweojii Naijiria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị

Kamgbe osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo kwetechara na gọọmentị etiti na-agba mbọ ikewapụta uweojii nke steeti, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akatọọla ya bụ mkpebi.

Ụfọdụ sị na ọ ga-ekewa Naijirịa ebe ndị isi steeti iri atọ na isii dị n'ala Naijịrịa kwetere na ya bụ nkewapụta uweojii steeti.

Ha gbadoro ụkwụ na ọ ga-eme ka echekwaa ime obodo ọfụma.

BBC Igbo gbara otu onye uweojii nọ ezumike nka n'Enugu steeti akpọrọ Emmanuel Ojukwu, ajụjụ ọnụ.

Ojukwu kwuru na kama ikewapụta uweojii nke steeti, na ọ ga-adị nma ka gọọmentị etiti kwado uweojii nke fedralụ na ngwaọrụ, ọzụzụ, ndụmọdụ na itinye ego.

Ọ sị kwa na ọbụru na Naijirịa na-achọ ịdị ka mba ndị ọzọ kewapụtara uweojii nke steeti, na ọ gaghị adabacha n'ihi na mkpa Naijirịa na nchekwa abụghị otu na ebe ndị mba ndị ọzọ nọ.

"I kewapụta uweojii nke steeti, ihe mere anya ga-eme imi."

Gere ihe Ojukwu kwuru n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye kọmishọna uweojii nọ ezumike nka kọwapụtara uche ya gbasara uweojii steeti

Isiokwu Ndị Emetụtara