Di na nwunye erela nwa ọhụrụ ha n'ọnụ ego naira 400,000

Nwa ọhụrụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A zọpụtara Chinecherem n'ọnwa Febrụwarị n'ụbọchị iri na asaa.

Ngalaba na-ahụ maka nyocha mpụ n'ụlọ ọru ndị uweojii n'Imo steeti a nwuchiela di na nwunye akụkọ kwuru na ha rere nwa ha Chinecherem

n'ọnụ ego naira nari puku anọ (400,000),ka ọmụchara nwa ọhụrụ.

Dị na nwunye a bụ Ifeanyi, iri ato na ise, na Emmaculata Elijah dị iri atọ bụcha ndị Amakpụ -Umuba, n'Isiala Ngwa North n'okpuru ọchichi dị n'Abia steeti.

Mana ha bị na Irete, na Owerri West n'okpuru ọchịchị Imo steeti.

Ndị ọzọ a na-enyocha sonyere na mpụ a bụ Grace dị iri ise na ise onye Ụmụọba Ụratta n'okpuru ọchichị Owerri North, Fedalia dị iri ise na ise bụkwa onye Umụoba Ụratta nakwa Amarachi dị iri anọ na itoolu onye sina n'okpuru ọchịchị Ideato North.

Onye na-ekwuchitere ndi uweojii ọnụ na Owerri bụ Andrew enwerem kwuru na di na nwunye tụkọtara alo na ntabị anya eji mụcha nwa ha nwaanyị were resi ya obiekwe site n'aka Mezu na Ariri.

Enwerem onye kwuputere na di na nwunye a amụọla ụm̀ụ asaa,siri na amaghị ebe ụmụ abụọ n'ime ha nọ.

O kwuru na onye isi ndi police n'Imo steeti nyere iwu ka a ma ha ikpe ma enyochasia mpụ a.

Enwerem sị na nwa ọhụrụ ahụ enwetaghị ihụnanya na nlekọta nne na nna ka amụchara ya. Di na nwunye kpakọtara nkata ka ha nara Naira 400,000 karia ma i nara nwa ha nwaanyi.

Ọ dị ka ihe nkiri mgbe ha nọ na-adọ ndorọndọrọ onye mere mpụ a.

Ufọdụ n'ime sị na ọ bụ nne nwa ahụ sonyere na mpu a mana ọ sị na aka ya adịghị ya.

Nwaanyị goro nwa ọhuru ahụ gwara ndị nta akukọ na ọ nyere Ifeanyi na Emmaculata ego ahụ na be ha.

Ifeanyi kwetere na ya na nwunye ya resiri Obiekwe nwa ha.

Isiokwu Ndị Emetụtara