Ụlọikpe akagbuola ebubo mpụ eboro Chimaroke Nnamani

Chimaroke Nnamani Image copyright Facebook/Nnamani
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii nwụchịrị Nnamani n'afọ 2017

Ụlọikpe ukwu nọ na Lagos kagburu ebubo mpụ na aghụghọ eboro onye chibụrụ Enugwu Steeti bụ Chimaroke Nnamani maka na ha sị na ahazighi ebubo eboro ya n'ụlọikpe ọfụma.

Ọkaikpe Chuka Obiozor sị na akwụkwọ iyi a na-akpọ 'affidavit' Nnamani gosiri ụlọikpe, gosiri na ekpeela ikpe banyere okwu ya kamgbe ụbọchị ise n'ọnwa Julaị nke afọ 2015 n'ụlọikpe ọkaikpe Mohammed Yunusa.

Rickey Tarfa, onye ọkaiwu Nnamani, gwara ulọikpe na onye ọ na-anọchite anya ya tinyere akwụkwọ iji gosi na ọkaikpe Yunusa ekpebiela ikpe ahụ n'ikpe nke FHc/L/09c/07.

Chọpụta akụkọ ndi ọzọ gbasara mpụ:

Mazi Tarfa, bụ ọkaiwu ukwu Naịjirịa, sị na ndị nọ n'ikpe ahụ nwere nkwekọrịta a na-akpọ 'plea bargain' n'asụsụ Bekee n'ihu Yunusa mgbe ahụ.

Ọ sikwa n'ụlọikpe Obiozor enweghi ike ịnụ ikpe nọ n'ụlọikpe ọzọ ya na nke ya ha nhatanha.

Kelvin Uzozie, onye ọkaiwu EFCC, sị na ya hụrụ 'affidavit' Nnamani ma tinye akwụkwọ ka-akagbuo ikpe ahụ wee nye ya ohere iweta ebubo ndị ọzọ a na-ebo Nnamani.

Ọkaikpe sị; "ekwerem na nkwekọrịta emere n'ụlọikpe a n'ụbọchị asaa nke ọnwa Julai nke afọ 2015. Ọ bụghị ikpe ziri ezi n'ihu m, ya mere m ga eji kpapụ ihe niile gbasara ya bụ ikpe a nọ n'ihu m."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara