Ndị na-emepụta ngwa ahịa n'Anambra sị ka arụọ ọdọ ehi n'ala Igbo

Otu nwoke na-achị ehi na ehi ya Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ha na-ebo ndị na-achị ehi ogbugbu ọtụtụ mmadụ n'ala Igbo

Onye isi ngalaba a na-akpọ 'Association of Small and Medium Scale Industries' na-asụsụ bekee nke dị na Anambra steetị bụ Justin Okolo na-rịọ ndị gọvanọ dị icheiche n'ala Igbo ka ha tinye ego na-ịmalịte ọdọ ehị (nke akpọrọ Cattle Colony n'asụsụ Bekee) dị icheiche n'ala Igbo.

Ha kwuru na onwere ike ị kwụsị nsogbu dị n'etịtị ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi n'ala Igbo ma bụtekwa ọrụ dị icheiche na-ebe ahụ.

Mazị Okolo kwuru na ya kwetara n'echiche onye isi ndị Ohanaeze ndi igbo bụ Nnia Nwodo banyere ịmalite ebe a na-azụ ehị.

Nwodo, n'ụbọchị ole na ole garaga, rịọ ndị ọrụ ugbo nwere ebe a na-azụ ehị tụpụ a lụọ agha Biafra ka ha laghachị na yabụ ọrụ makana udị ọrụ nwere nnukwu uru.

Nwodo ka na-arịọ ndị gọvanọ steeti ahụ ka ha nye aka maka ọtụtụ ụmụ afọ anaghị enwe ọrụ.

Okolo gwara ndị nta akụkọ na echiche ya bụ na oge eruola mgbe ndị Igbo ga amalite ọrụ di icheiche ga eweta ego na akụnụba.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara