Ipob egosila iwe ha na-ebe Ikpeazu nọ

IPOB Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

Ndi otu IPOB asaala Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu gbasra ihe o kwuru maka onye isi ha.

Site n'akwukwọ ozi ọnu na-ekwuchitere ndi Ipob bụ Emma Powerful detara BBC Igbo, o kwuru na ndi mmadụ ga na-akatọ sị ihe gọvanọ IKpeazu kwuru maka Nnamdi Kanu.

O makwara aka si Gọvano Ikpeazu na ndị Ugwu Hausa na-akwado ya depụta ihe niile ga-akwado ihe o kwuru maka onye isi ha,tumaadị na onye isi ha gbahapụrụ Gọvanọ ndi ọwụwa anyanwụ mgbe BBC

Igbo service gbara ya ajụju ọnụ.

N'ọnụ ya,"gwa ụwa ebe,mgbe ya na ndị ya so zụkọta Nnamdi Kanu. Anyi agaghị ekwe ka ọ gbanahụ asị ọtụru maka onye isi anyi".

Ọ sị na ihe ọbula Govanọ Ikpeazu kwuru gbasara onye isi ha emetutaghị ha makana ọ bụ cha asị.

Okwu a pụtara na nkwado Ikpeazu na ndị gọvanọ ndị ala Igbo ndị ọzọ kwadoro ndị agha Naịjirịa mgbe ha mere njeghari ha kpọrọ "Egwu Eke" n'ala Igbo na afọ 2017.

Ahụgbeghi Nnamdị Kanu kemgbe ndị otu ya si na ndi agha Naịjirịa wakporo be nna ya. Ndị agha Naịjirịa na-agọ na Kanu anọghi ha na-aka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: