Ntaramahụhụ n'ụlọakwụkwọ: O kwesịrị ka a machie ya?

Ndị uwe ojii Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ha na-arụ ndị agha na ndị uwe ojii aka na ha na-mmekpe ndị mmadụ

Otu nwata akwụkwọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Queendaline Ekezie na-aga Army Day Secondary School dị n'Obinze, Owere(Owerri), Imo steeti anwụọla maka ntaramaahụhụ, 'wụọ dika awọ' ndị agha abụọ nyere ya.

Akwụkwọ ntaakụkọ Punch kwuru na ndị agha abụọ nyere Queendaline ntaramaahụhụ a makana ọ bịaghị akwụkwọ n'oge.

Mana oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjịria na Imo steetị bụ Haruna Tagwaị kwuru na ọ maghị maka mkpamkpa nke a.

Ọ sịrị: "Onwebeghị onye gwara m ihe ọ bụla banyere ọdachị a. Ọ bụ n'akwụkwọ akụkọ taa ka m gụtara ya."

Mkpamkpa a malitere mkparịtaụka maka inye ụmụaka oke ntaramaahụhụ nke a kpọrọ cọroral punishment na bekee.

Dịka otu ọkaiwu aha ya bụ Lanre Lasisi siri kwuo, nne na nna nwataakwụkwọ ahụ nwụrụ nwere ịkpụpụ ndị agha abụọ ahụ ụlọikpe.

Lasisi kwuru: "Makana ị bụ onye agha agaghị enye gị ikike ịmerụ nwataakwụkwọ arụ maka na ị na-ata ya ahụhụ. Onweghị onye karịrị iwu ala ọbụla.

"Ihe a bụzị ihe gbasara ọchịchị obodo. Ha kwesịrị ikpe ndi agha n'ụlọ ikpe. Makana abụghọ ikpe ọnwụ."

Mana otu dibia na-ahụ maka akọ na uche a kpọrọ psychologist na bekee, bụ Chimezie Elekwachi Lekwas kwuru na inye nwata oke ntaramahụhụ ga-eme ka ụbụrụ ya kpọchie.

" Nwata

Gee ihe Chimezie Elekwachi Lekwas gwara anyi:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỊpịa ụtarị na ntaramahụhụ dị icheiche bụ ụzọ esi adọ ụmụaka aka na ntị ma ha mehie

Otu nwaanyị nkuzi nọ na-ezumike nka bụ Margaret Okere kwukwara na ihe ịta nwata ahụhụ bụghị ihe ọjọọ.

"Inye nwata ntaramaahụhụ abụghị ihe ọjọọ, mana uche gị kwesịrị ịdị ya ka ọ ghara ịkarị akarị."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

EFCC agbala Ihejirika ajụjụọnụ

Ipob asaala Gọvanọ Ikpeazu

Isiokwu Ndị Emetụtara