Premier League: Nke a bụ ọgụ ndị dimkpa

kelechi Iheanacho nyere goolu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Iheanacho nwa afọ Naịjirịa bụ onye otu Leicester City

Asọmpị egwuregwu bọọlụ dị icheiche ga-eme na ngwụcha izu a ga-ekpo ọkụ.

N'asọmpị iko Premier League, Leicester City na Stoke City ga-asọ mpi.

Newcastle na AFC Bournemouth ga-asọ mpi nke ya.

Ndị ọzọ bụ Liverpool na West Ham United, na Watford na Everton.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ nke mbu Arsenal so na asọmpị UEFA/Europa ke mgbe afọ 2000

N'egwuregwu nke ụnyaahụ, Ostersunds FK meriri Arsenal ọkpụ abụọ a satara otu.

Arsene Wenger bụ onye nkuzi Arsenal kwuru na mmeri ha meriri Ostersunds FK n'izuụka gara aga bara ha n'isi.

"Anyị amaghị ihe a ga-eji bọọlụ mere, ihe a bụtere anyị nnukwu nsogbu."

Newcastle na AFC Bournemouth

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Newcastle ha ga-emerị na nke a?

N'asọmpị nke a na-abịa na ngwụcha izu a, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ Stehen Mbonu gwara BBC Igbo na asọmpị a nwere ike ị ga ụzọ abụọ.

"Bournemouth na Newscastle bụ otu bọọlụ nọ n'ime otu ọnọdụ. Onweghị onye mara onye ga-enwe mmeri."

Liverpool na-agbanị ịba ọkwa anọ nke mbu

Stehen Mbonu kwukwara n'asọmpị ole na ole gara aga, Liverpool ka na-agba ọfụma.

N'asọmpị Liverpool na West Ham United, Stephen nwere olileanya na ndị egwuregwu Mohamed Sala, Sadio Mane ga-eme ọfụma.

"Liverpool nwere nsogbu ndị na-agba bọọlụ na etiti na ndị azụ. Otu a kwesịrị ịzụ ndị egwuregwu ọhụrụ n'oge ahịa n'abịa."

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara