Komla Dumor Award 2018: Ị chọ onye na-awapụta dịka ọpụrụiche na ntaakụkọ n'Afrịka

Komla Dumor

Ụlọọrụ BBC na-achọ ọpụrụiche na-awapụta ma na-eto eto n'ọrụ ntaakụkọ maka nturuugo mbaụwa nke Komla Dumor BBC na-eme nke afọ 2018.

A na-akpọku ndị ọrụ ntaakụkọ na mpaghara Afrịka niile ka ha tinye akwụkwọ maka nturuugo ahụ nke na-achọpụta ma na-akwalite ndị ọpụrụiche na Afrịka.

Onye meriri ga-arụ n'isi ụlọọrụ BBC na London ka wee mụọ maka ọrụ ntaakụkọ.

Idenye akwụkwọ maka nturuugo a ga-akwụsị ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị afọ a bụ 2018 ma ọ kụọ 12:59 nke ime abalị.

A malitere nturuugo ahụ iji kwanyere Komla Dumor ugwu. Ọ bụbu onye ntaakụkọ pụrụiche si mba Ghana na-arụbu n'igwe TV nke akụkọụwa BBC. Ọ nwụrụ na mberede oge ọ gbara afọ 41 n'afọ 2014.

Nturuugo nke afọ a na-amalite n'isiobodo mba Ghana bụ Accra.

Nke a bụ maka onye ọpụrụiche na-arụ ọrụ ma biri n'Afrịka, onye maara eji ọrụ ntaakụkọ site n'ịgbasaozi n'ikuku nakwa ịkọ akụkọ pụrụiche gbasara mpaghara Afrịka ma chọọ ị bụ onye ama ama n'ọdịnihu

Tinyere ịnọ n'isi ụlọọrụ BBC na London, onye meriri ga-emekwa njem gaa mba Afrịka maka ịkọ akụkọ a ga-ekesa na mpaghara mba ụwa niile.

Nkenke aha onyonyo Onye meriri n'afọ 2017 bụ Amina Yuguda dere akụkọ maka nsogbu gbasara gburugburu oge ọ nọ na BBC

Ndị meriburu na nturuugo ahụ bụ Nancy Kacugira bụ onye mba Uganda, Didi Akinyelure onye ala Naịjirịa na Amina Yuguda bụkwa onye Naịjirịa.

Maka isiọrụ o mepụtara, Amina dere akụkọ maka ihe imaka n'ihu na-eche iyi Lake Victoria na mba Uganda, iyi kachasị ibu na mpaghara Afrịka nke ndị nyocha sayensi kwuru na o nwereike ịnwụ.

Amina kwuru,"Ị bụ onye meriri nturuugo Komla Dumor nke BBC afọ 2017 dị m ka ọ bụ mbido ọrụ m. I nweta ohere na mba ụwa nakwa ndị mbaụwa ịmata maka m dịka ka m erutela."

"Oge m nọ na BBC, amụtara m mkpa eziokwu, inye mmadụ niile ohere nakwa ige olu mmadụ niile dị. Amụtakwara m ụzọ pụrụiche iji mee ka akụkọ gbasara Afrịka masị ụwa niile.

"Obi dị anyị ụtọ dịka Komla si gosipụta ụwa niile, ọ masịkwara m na-eso m na-eme ka ụkpụrụ ya na-aga n'ihu."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDịka a na-amalite nturuugo Komla Dumor nke afọ a, ndị otu ya n'ụlọọrụ na-echeta ọrụ ya

Amina ga-esonye na mmalite nuturuugo nke afọ 2018 ya na Jamie Angus bụ onyeisi BBC otu mba ụwa.

Dịka o kwuru tupu a malite ya:

"Ọ bụ ihe dị ugwu ị nọ ebe a na Ghana na be Komla n'etiti ezinaụlọ ya na ndị enyi ya icheta ụkpụrụ ya nakwa ịchọta onye ọzọ na-awapụta na ntaakụkọ na mpaghara Afrịka.

"Mmadụ atọ ndị meriburu - Nancy, Didi na Amina - ha niile egosipụtala na ha nwere onyinye pụrụiche n'ihe gbasara ọrụ ntaakụkọ ma gbakwa mgborogwu siri ike na nghọta ihe gbasara mpaghara Afrịka na etu a ga-esi jikọta ndị ime obodo Afrịka maka mgbasaozi.

"Anyị na-ele anya ịhụ onye ntaakụkọ ọzọ pụrụiche si mpaghara Afrịka anyị ga-anabata dịka ndị meriri nuturuugo ọhụrụ nke Komla Dumor BBC."

  • Maka ịhụ ka i ruru isonye nakwa idenye akwụkwọ, pịa ebe a
  • I nwekwara ike ikesa ozi a n'igwe mgbasaozi ọgbara ọhụrụ bụ social media site n'akara #BBCKomlaAwards.

Ihe ndị ọzọ i kwesiri ịma maka Komla Dumor

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionThe BBC's Komla Dumor had a wide-ranging career as an interviewer and presenter

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a