INEC: Mbinyeaka 2019 ga-akwụ ọtọ

Mbinyeaka Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Mbinyeaka ikpeazụ Naijirịa mere bụ n'afọ 2015

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijịrịa bụ Inec ekwuola na a ga-akagbu mbinyeaka na mpaghara ọ bụla e nwere mmejọ.

Onyeisi Inec n'Imo steeti bụ ọkammụta Francis Ezeonu kwuru na mbinyeaka na mpaaghara ọ bụla ebe e nwere mpụchara akpati e ji eme ntuliaka, ka bụ ihe efu.

O kwuru nke a taa mgbe ọ na-eme ngagharị mgbasa ozi n'okpuru ọchịchị Aboh Mbaise dị n'Imo steeti.

O kwuru na Inec dị njikere maka ime ntuliaka ziri ezi nke na-enweghị nwakpo na mmenyeụjọ ma na-arịọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị jikọta aka n'ịhụ na mkpebi a bịara na mmezu.

Ezeonu kwuru na a ga-enwe ihe puru iche na ntuliaka nke na-abia n'afọ 2019 n'ihi na Inec edoziela ụlọ ya iji wee gbochie nrụrụaka na aghụghọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara