Izu Afrịka na foto: Site Febrụwarị 16 ruo 22 nke 2018

Nhọpụta foto kacha mma si na mpaghara Afrịka na nke ndị Afrịka nọ ebe ndị ọzọ n'ụwa n'izu a.

Ndị otu na-ahụ maka nlekọta anụọhịa na Kenya buliri enyi agbara ọgwụ mere ka ọ nọrọ jụụ tinye ya n'ime ụgbọala trọk n'obodo Lamuria dị na Nyeri county, n'ụbọchị 21 nke Febrụwarị 2018 ka ha si Solio, Sangare na Lewa ebuga enyi n'ogige ụmụanụmanụ dị na mpaghara ugwu Tsavo East dị na Ithumba. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọbụghị kwa ụbọchị ka ị ga-ahụ enyi kpodoro isi n'ala ma koro n'ikuku - mana n'ụbọchị Wenesde na obodo Nyeri county dị na Kenya, ihe a bụ ihe mere eme.
Ndị otu Canada Carpe Diem Circus mere ihe ngosi n'ụlọakwụkwọ ndị French n'ụbọchị 15 nke Febrụwarị 2018 ka e mere emume circus nke mbụ n'Abidjan dị n'Ivory Coast. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ ndị mmadụ nọ na-efe efe n'Abidjan, Ivory Coast, ka a na-eme mmemme bekee kpọrọ circus nke mbụ ha.
Ndị na-eru uju na ndị nkwado otu pati Movement for Democratic Change (MDC) feere Morgan Tsvangirai bụ onye ama ama maka ịma aka n'ihu na Zimbabwe aka ka a na-eli ya n'obodo ya na Humanikwa dị na Buhera, n'ụbọchị 20 nke Febrụwarị. Ọnwụrụ ka ya na ọrịa kansa lụchara ọgụ. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Na Zimbabwe, ndị mmadụ gbakọrọ iru uju maka ọnwụ onyeisi otu Movement for Democratic Change (MDC) bụ Morgan Tsvangirai, onye nwụrụ ka ọ dị afọ 65.
Nwa amụrụ ọhụrụ n'ụlọọgwụ nkuzi Juba dị na Juba, isi obodo South Sudan, n'ime ọnụụlọ nwere nanị akwa ise na ọkụ latrik nke anwụ na-akwado Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo N'otu ụbọchị ahụ, otu nne mụrụ nwa ya n'ụlọọgwụ dị na Juba, South Sudan. Obodo ahụ bụ otu n'ime ebe ndị kachasị njọ inọ mụọ nwa n'ụwa, dịka Unicef kwuputara n'izu a.
Ndị agha Ethiopia abụọ lụrụ agha yi ekike ndị agha na-agbada n'ụzọ ka emere ụka ncheta ụbọchị 'mgbuchapụ ndị Addis Ababa'. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo N'Ethiopia, ndị agha lara ezumike nka mere ncheta ndị egbuchapụrụ n'Addis Ababa, oge ndị agha Italy bigidere ha gburu ndị Ethiopia ruru 20,000 n'ụbọchị 19 nke Febrụwarị, 1937.
Ndị Libya fere ọkọlọtọ ha ka ha gara emume ncheta afọ asaa ọgbaaghara chuturu onyeisi ha nwụrụ anwụ bụ Moamer Kadhafi, na Martyr's Square dị n'isi obodo Tripoli ụbọchị 17 nke Febrụwarị. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Libya chetakwara ụbọchị dị mkpa n'izu a. Ụbọchị 17 nke Febrụwarị, mere ya afọ asaa nke ọgbaaghara butere nchutu Col Muammar Gaddafi.
Ahụrụ otu ọkọlọtọ mgbasa ozi nke ntuliaka ndị nkwado onyeisiala Egypt tinyere n'isi obodo Cairo n'ụbọchị 20 nke Febrụwarị, 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Igafee oke, Egypt na-akwado maka ntuliaka. Ndị nkwado tinyere ọkọlọtọ mgbasa ozi maka onyeisiala ha na Cairo n'izu a.
Onyeisiala ọhụrụ Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa (nọ n'etiti) abatala ikwu okwu gbasara ihe na-eme n'obodo na Parliament dị na Cape Town, n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Saụt Afrịka enwebeghị ntuliaka, mana ha nwere onyeisiala ọhụrụ. Ahụrụ Cyril Ramaphosa ebe a tupu o mee nkwuputa gbasara ihe na-eme n'obodo nke bekee kpọrọ State of the Nation address. Ọ ga-amasị anyị ịma ihe nwaanyị a hụrụ ugbu a.
Onye ọsọ skeleton nke Ghana bụ Akwasi Frimpong pụrụ ka ọsọ ya gwụrụ n'ime asọmpi skeleton nke ụmụnwoke emere na sliding centa nke olimpik ka a na-eme egwuregwu olimpik naPyeongChang, South Korea, n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị2018. Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo N'akụkụ ụwa ọzọ na mba Saụt Korea, onye ọsọ skeleton si Ghana bụ Akwasi Frimpong nọ na-egosi nwa ya enyi ọhụrụ.
Ndị egwuregwu sọrọmpi ngwụcha nke ọsọ 800m ụmụnwoke ka a na-eme nkwado maka egwuregwu Commonwealth nke 2018, n'ọgbọ egwuregwu nke Kasarani dị na Nairobi, Kenya, n'ụbọchị 17 nke Febrụwarị 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Mana na Kenya, echiche na-abanye n'ime asọmpi nnukwu na-abịa - egwuregwu Commonwealth n'Australia n'Eperelụ.

Ndị nwe foto a bụ AFP na EPA

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a