Ọgbaaghara APC: Oyegun asaala Tinubu

John Odigie-Oyegun Image copyright @APCNigeria
Nkenke aha onyonyo John Odigie-Oyegun na Tinubu na-enwebu esemokwu n'ime pati ha

Iji gọpụ na ebubo eboro ya, onyeisioche otu APC bụ John Odigie-Oyegun kwuru na ya kwụ Bola Ahmed Tinubu na-azụ na mbọ ọ na-agba idozi esemokwu dị na pati ha.

N' akwụkwọ ozi Tinubu degara Oyegun abalị ole na ọle gara aga, o kwuru na Oyegun na-etinye aka enwe n'ofe n'ihe gbasara ọrụ idozi esemokwu dị na pati ha nke onyeisiala Naijiria bụ Buhari nyere ya.

Na ọsịsa ya, Oyegun kwuru na ya matara na ọrụ ahụ nke onyeisiala nyere Tinubu tara akpụ, ma kwe nkwa ị kwado ya.

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị, "Ka m kelee gị ọzọ maka ọrụ ịkpa udo nke onyeisiala nyere gi.

"Ọ bụ ọrụ tara nnukwu akpụ mana ekwenyere m na obisike nke onyeisiala nwere na gị mere ojiri nye gị ọrụ ahụ. Aga m enye gị ezi nkwado ịrụ ya."

Oyegun zigakwara akwụkwọ ozi ahụ Buhari, osote ya bụ Yemi Osibanjo, onyeisi Sineti, bụ Bukola Saraki, onyeisi ụlọomeiwu nke nta, Yakubu Dogara, bụ ndị Tinubu nyere akwụkwọ ozi o degara Oyegun.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: