Rivers: Ụkọchukwu egbuola enyi ya nwaanyị,ndị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii jidere Pastọ Okoroafor maka ị gbu onye ụka ya ị ji zochie ihe nruruaka ha mere
Pastọ Okoroafor Chidebere ebola ekwensu na ọ bụ ya kwanyere ya igbu mmadu atọ.
Chidebere kwetara na ya gburu ndị a mgbe ndị uweojii bisara ya nwa aka ị me ka ọ sa asịsa n'isi ụlọ ọrụ ha dị na Mosco Road, Port Harcourt, River Steeti.
Ndị gbara ya bụ Pastọ n'anwụ bụ ndị agbataobi onye o gburu nke ọ gwara e be ọ na-ga.
Dịka onye osote onyeisi ndị uweojii, Cyril Okoro, siri kwuo mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ, ọ sị na nchọpụta ndị CID mere gosiri na ya bụ nwa amadị na ụmụagbọghọ na-abịa ụka ya n'enwe mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke mere na ọ tụwara otu n'ime ha bụ Uloma Onweagbo ime.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Ụfọdụ akwụkwọ akụkọ kọrọ na Okoroafor sịrị nwaada ahụ ọ tụwara ime ya tepụ ya mana ọ jụru, nke a mere o jiri memila ya bụ nwaada dị afọ iri abụọ na ise na nzuzo iji zochie arụ ọ kpara.
Mana ụfọdụ kọrọ na Uloma na enyi ya nwaanyị bụ Ada Ezeawa gara ịgwa Okoroafor maka ime ahụ ọ tuwara ya.
Nke a were Okoroafor iwe mere o jiri rara ha puo ebe zoro ezo ga gbufuo ha abụọ ma nwa Uloma kwọ na azụ.
Okoro sịrị na" nchọpụta gosiri na o jiri akwa kegbu nwa ahụ".
Site n'ajụjụ ọnụ a gbara ndị agbataobi ka e jiri chọta ọzụ Uloma na nwa ya n'ime ọhia dị n' Afam-Igberu Road, dịkwa na Port-Harcourt.