Ugboro ole ka ị na-asa eze n'ụbọchị ?

Toothbrushing Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọkachamara ahụike eze kwuru na o kwesịrị ka a sa eze ụgbọrọ abụọ n'ụbọchị

Na nnyocha emere mmadụ puku abụọ na Amerịka, a chọpụta na "otu n'ime ụzọ atọ ndị gbara afọ 18-34 na-asa eze sọ otu ugboro n'ụbọchị, ebe ụfọdụ anaghị asa ruo abali abụọ.

Nchọpụta ahụ kwukwara na ọbụladị n'okenye, ọtụtụ anaghị eleta eze ha, ebe ndị dị pacenti iri isii na abụọ na-atụ ụjọ ị ga-hụ dọkịta na-ahụ maka eze.

Onye dọkịta na-ahụ maka eze bụ Olabode Ijarogbe gwara BBC na o kwesiri ka mmadụ taa atụ ugboro abụọ n'ụbọchị.

Ijarogbe onye bụ onyeisi otu ndị dọkịta na-ahụ maka eze na Naijiria akpọrọ 'Nigerian Dental Association' na bekee sị: "Ụgbọrọ abụọ kwa ụbọchị; ma i richa nri ụtụtụ na ikpeazụ tupu ịlaba ụra. Ihe ndị mmadụ na-emekarị bụ ịsa eze ọzigbọ ha tetera ụra."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ụfọdụ ndị ndị ntaakụkọ anyị jụrụ ugboro ole ha na-asa eze n'ụbọchị kwuru na ọ bụ otu ugboro.

Otu okorobia a kpọrọ Chris Nas dị afọ ịrị atọ zara sị: "Otu ugboro n'ụbọchị. Ma mgbe ụfọdụ, e nwere m ike ghara ịsa ya otu abalị aga."

Dkta Ijarogbe kwuru na-agbasoghị usoro kwesiri iji lekọta eze nwere ike ibute ọrịa dị icheiche dịka eze ure(nke a kpọrọ dental caries), eze isi, anyụrụeze ịza aza(nke a kpọrọ periodontal disease) na ọnwụ.

Dịka Dkta Olabode Ijarogbe siri kwuo,ọ bụrụ na agwọghị ọria eze, o nwere ike igbu mmadụ.

"Ọtụtụ ihe ndị dị na-akụkụ ahụ ndị ọzọ dịka agbara na anụahụ dị n'eze nke bụ na ihe metụtara eze, ọ bụrụ na onweghị ihe e mere ya, mmadụ nwere ike isi na ya nwụọ."

Isiokwu Ndị Emetụtara