Owere: A nwụchiela onye ohi ụlọakụ

Onye a tụrụ ịga Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye a tụrụ ịga

Oge a kpụpụtara Chinonso Onwuegbuchulam bụ onye Obazu Mbieri dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli n' Imo steeti ka ọha hụ ya, onyeisi ndị uweojii Imo steeti bụ Chris Ezike kwuru n'ejidere ya ebe o zoro na Port Harcourt, Rivers steeti.

Ezike kwuru na diọkpa ahụ kwetara na o so kpaa mkpamkpa ahụ nke o nwetara puku naira 400, n'ime nde naira 2.8 ha zutere n'ụlọakụ ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Onwuegbuchulam kọwakwara na ya banyere n'ọrụ iji egbe aga ohi kamgbe afọ 2012, ma sonyekwara n'ọtụtụ iji egbe zuo ohi nke mere n'Owere, Lagos na Port-Harcourt, bido oge ahụ were ruo afọ 2017.

Cheta na n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Februwarị afọ gara aga, n'oge elekere atọ nke ehihie, ndị ojiegbeezuohi dị mmadụ anọ so otu onye gara ụlọakụ dị na Wetheral Road, Owere, banye ọgba ụlọọbaego ahụ.

Ha gbara egbe iji chụpụchaa ndị mmadụ na ndị uwe ojii atọ nọ ọrụ na ụlọakụ ahụ, ma zuru ego.

E mechara nwụchie mmadụ atọ ma gbagbuo ha, ebe otu gbara ọsọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara