Somalia al-Shabab: Ogbunigwe egbuola mmadụ 38

Mwakpo Mogadishu dị na Somalia Image copyright Universal TV/Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ kwenyere na ọ bụ ha mere mwakpo a

Ogbunigwe etinyere n'ụgbọala abụọ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri atọ na asatọ n'isi obodo Mogadishu dị na mba Somalia.

Mwakpo nke mbụ mere n'ihu ebe obibi onyeisiala ha n'ime ụbọchị Fraịde, Febrụwarị 23.

Nke abụọ mere n'ụlọ nkwari akụ dị nso ebe ahụ. Ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ.

Ndị omekataraihepụọụjọ a na-akpọ Al-Shabab na-achọ ụzọ ha ga-esi achụpụ ndị ọchịchị Somalia kwuru na ọ bụ ha kpara mkpamkpa abụọ a.

Ndị ọchịchị kwuru na-emechara lụọ ọgụ egbe n'akụkụ ebe e mere mwakpo, nke butere ọnwụ ndị ọmekataraihepụọụjọ ise.

Mwakpo ogbunigwe a bụ nke ọhụrụ n'ime usoro mwakpo ndị e boro Al-Shabab bụ ndị jibu obodo Mogadishu n'ọrụ tupu ndị agha African Union achụpụ ha na 2011.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Akpọgara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ

Ụlọọrụ ntaakụkọ steeti ha kwuru sị na mwakpo nke a bidoro ka otu ụgbọala jụrụ ịkwụsị n'ebe ọnọdụ ndị nche dị n'ihu ebe obibi onyeisiala ha tupu ọ gbarie.

Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ bidoro ịlụ agha egbe n'etiti onwe ha.

Otu ụgbọala wee gbarie n'akụkụ ụlọ nkwari akụ ahụ.

Kama, ndị Al-Shabab kwuru sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ahụ ka ha chọburu igbari.

Ndị otu ahụ kwuru sị na mmadụ ise n'ime ndị agha ha, tinyere ndị ọkwọ ụgbọala abụọ ahụ, "nwụrụ maka okwukwe ha" ebe ndị agha 35 nwụrụ n'ime mwakpo a.

Otu onye uweojii gwara onye ntaakụkọ Reuters na "ọtụtụ ndị agha nọ na-eche nche n'ụzọ dị nso ebe obibi onyeisiala."

Akụkọ ga-amasị gị: