Ị ma na ọjị anaghị anụ bekee n'ala Igbo?

Oji Igbo

Ebe foto si, Nwabueze Nwonwu

Nkọwa foto,

'Onye wetara ọjị wetara ndụ'

Ọjị bụ otu ihe ị ga-ahụrịrị n'emume ọbụla gbasara ala Igbo.

Ọjị na ịwa ọjị dị oke mkpa n'omenala ndị Igbo, maka na Igbo na-ekwu na "onye wetara ọjị wetara ndụ".

Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ỌJỊ pụtara "Omenala Jikọtara Igbo".

Etu esi enweta ọjị

Ọjị bụ mkpụrụ osisi a na-akụ akụ ma na ọ na-epukwara onwe ya.

Ọjị nwere ike ịmị n'ụlọ ma mịkwaa n'ọhịa.

Ụdịrị ọjị dị

Enwere ụdịrị ọjị dị iche iche, ụfọdụ na-aza aha site n'etu o si mịpụta.

Abịa na Naịjirịa, enwere ọjị Igbo ma nwee ọjị ugwu Awụsa ma nwekwaa nke ndị ọdịda anyanwụ bụ ndị Yoroba.

Ọjị Igbo na-agbakarị n'ibe sitere n'atọ ruo ibe asaa.

Igbo na-akwanyere ọjị gbara ibe asaa ugwu, ụfọdụ na-egbukwa ọkụkọ ma ha hụ ya bụ ọjị.

Nkọwa foto,

Ọjị Awụsa

Aha ọjị dị iche iche

  • Ọjị ugo bụ nke na-acha ọcha, a na-akpọ ya ugo maka na ọ na-ama mma n'anya
  • Ọjị ikenga na-enwe ibe atọ, na-achakarị uhie uhie
  • Ọjị ndị awụsa bụ nke a na-akpọ 'gworo', ọ na-enwe ibe abụọ na-achakarị ọcha
Aha onyonyo,

Lee ihe omimi ị maghị maka ọjị

Uru ọjị bara

Ndị Igbo kwenyere na ọjị anaghị anụ bekee n'ụzọ ọbụla, ya mere eji eji ya eme omenala ndị Igbo dị iche iche dịka:

  • Eji ọjị alụ nwaanyị n'ala Igbo
  • Eji ọjị anabata ọbịa
  • Eji ọjị edozi esemokwu n'etiti ndị mmadụ
  • Eji agba agọ ọfọ/ekpe ekpere
  • Eji ọjị achụ aja
  • Eji ọjị agba ndụ
  • Eji ọjị akwa ozu

N'ala Igbo, inye onye ọbịa ọjị gosiri na ị nabatara ya, o na-egosikwa na ị hụrụ ya n'anya nke ukwuu ma nwekwaa ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ.

Ihe a na-eji ata ọjị

N'omenala Igbo, enwere ihe ndị ọzọ a na-eji ata ọjị

  • Ose ọjị nke bekee kpọrọ alligator pepper
  • Akị ilu nke bekee kpọrọ bitter kola
  • Mmịmị
  • Ụfọdụ na-eji nzu ata ọjị
  • Ose ọjị akwọrọ akwọ
Aha onyonyo,

Kola nut: Etu e si akwanyere ọjị ugwu n'ala Igbo

Ịwa ọjị

Tupu awaa ọjị n'ala Igbo, a na-ebu ụzọ gọọ ọjị (kpeere ya ekpere). Ọ bụ iwu na onye kachasị bụrụ okenye ga-agọ ọjị, ebe ụfọdụ na-enye onye kacha bụrụ nwata ka ọ waa ya ma kesaa ya.

Nwoke anaghị awa ọjị na be ndị ọgọ ya, ọ gaghị awakwa ọjị ebe ndị tọrọ ya nọ na-abụghị ma ha nyere ya ikike ịwa ya.

Ọ bụkwa iwu na nwaanyị anaghị awa ọjị n'ala Igbo.

Ọjị na ụmụnwaanyị

N'ala Igbo, nwaanyị anaghị arị elu ọjị, ọ naghị aghọtu ọjị n'osisi ya.

Nwaanyị anaghị agọ ọjị.

Ebe foto si, Nwabueze Nwonwu

Nkọwa foto,

Nwaanyi anaghị arị oji elu mana nwaanyị na-ere oji

Anaghị ekwe ka nwaanyị tinye aka n'ime efere were ọjị ma ọ bụrụ na ụmụnwoke nọ ebe ahụ ewerechabeghị.

Ụfọdụ na-aga n'ihu were aka ha nye nwaanyị ọjị ka ọ ghara inwe ohere tinye aka n'efere e jiri kee ọjị.

Lee ihe nkiri a ịhụ ka Pete Edochie si gọọrọ BBC Igbo ọjị:

Aha onyonyo,

Pete Edochie gọrọ BBC Igbo ọjị

Na ụka bịara egbochighị ndị mmadụ iji ọjị ekpe ekpere dịka esi eme ya mgbe gboo.