Chigul: E bidoro m na nwata kpawa ọchị
Chigul: E bidoro m na nwata kpawa ọchị
Nwaada akpọrọ Chioma Omeruah ma ọ bụ Chigul, onye ama ama n'ihe ịkpa ọchị ekwuola n'ịkpa ndị mmadụ ọchị bụ ihe dị ya n'ọbara.
N'ajụjụọnụ ndị BBC Igbo gbara ya, Chioma kwuru na ihe ọ bụla mmadụ mere ma ọ bụ kwuru, na ya nwere ike i mee dịka onye ahụ jiri mee ya.
O kwuru ka ụmụnwaanyị ndị nwere ụdị onyinye a, pụta ma were ya mee ezigbo ihe na-emeghi ihere ọ bụla.