Dapchi: Gọọmenti sị na ha tinyere uju n'ịchọ ụmụakwụkwọ a tọọrọ

Ụlọ akwụkwọ Dapchi Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụlọ akwụkwọ umụnwaanyi na Dapchi ke mechiri emechi

Gọọmenti Naịjirịa na-akọwa na ha ezipụla ụgbọelu na ndịagha ọhụrụ, ha tinyere na nke ha zipụrụ na mbụ maka ihu na hụrụ ụmụaka 110 na-efụ na Dapchi, Yobe steeti.

Ụmụakwụkwọ a fụrụ mgbe ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram wakporo ụlọ akwụkwọ ha na ụbọchị 19 nke Febụwarị nke afọ a.

Onyeisiala Mohammdu Buhari kpọrọ ihe mere ụmụakwụkwọ a 'ọdache metụtara Naịjirịa niile' ma rịọ nne na nna ụmụakwụkwọ a mgbaghara.

Mwakpo a mere ka ndị mmadụ cheta ihe mere mgbe Boho Haram nwụchịkọrọ ụmụakwụkwọ na Chibok n'afọ 2014.

Ndị nwe ụmụakwụkwọ a na-efu na-ajụ ndị gọọmenti ajụjụ

Iwe na ewe nne na nna ụmụnwaanyị a na-efu ka akuko na-apụta na-ewepụrụ ndịagha nọ ọrụ nchekwa na Dapchi n'ime ọnwa gara aga.

Awakporo Dapchi, nke nọ ihe dịka 275km (170 miles) n'ugwu ọdịda anyanwụ Chibok, n'ụbọchị Mọnde gara aga, mere ụmụakwụkwọ na ndịnkụzi nọ na ụlọakwụkwọ Government Girls Science and Technical College ịgbaba ọhịa nọ ha nso.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị nwe ụmụakwụkwọ Dapchi na ewe iwe

Ndị bi Dapchi na-akọwa na ndịagha Naịjirịa ji ụgbọelu na ndịagha gbochie ma chụna ndị a na awakpo obodo a.

Na mbụ, ndị gọọmenti Naịjirịa gọọro na onweghi nwata akwukwọ atọọro, ma na-akọwa na ha no ọhịa na ezoruru ndi oji egbe a.

Mana ha mechara kweta na ụmụakwụkwọ 110 na-efuka mwakpo a mechere.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Edepụtala aha ndị na-efu na Dapchi

Ndi Boko Haram na ebuso gọọmenti Naịjirịa agha iji kepụta mba alakọba na ụwụwa anyanwụ na ugwu Naịjirịa.

Agha a egbuola mmadụ puku puku, ma mee ka atọọrọ puku puku ndị ọzọ.