Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada

Mma Image copyright Getty Images

Otu nwoke a na-akpọ Stephen Nnadiogo dị afọ iri anọ na asatọ ka ndị ntaakụkọ na-akọwa na o gburu ọchụ na Ntueke Street nke dị n'Awada Obosi.

Nnadiogo ji mma gbuo ụmụ anọ ya na nwata ya na ha bi, tupu o gbuo onwe ya.

Ụmụaka ya dị afọ abụọ ruo afọ iri, ebe nwata nwaanyi ahụ a na-akpọ ọgechi dị afọ iri na asatọ.

Nnadiogo bụ onye Isu Njaba nke di n'Imo steeti.

Ụlọ ntaakụkọ Punch nke Naịjirịa sị na Nnadiogo na nwunye ya bu Chika Nnadiogo dị afọ iri atọ na abụọ na-enwe nsogbu n'ụlọ ha. Ha gakwara n'iru kọwa na Nnadiogo boro nwunye ya ebubo na ọ na-agba n'ezi.

Ndị ma maka ezinụlọ a kwuputara na Chika na-agwa di ya na ọ bụghị ya mụrụ ụmụ ha ma ha na-ese okwu.

Punch kwuru na otu onye hụrụ mgbe ihe a mere sịrị na ọ bụ mgbe Chika gara ebe ọ na-ere ọgwụ na mgbede ka arụ ahụ mere.

"Chika sịrị na ya na-agba n'ezi maka di ya abụghị nwoke. Chika na-akpọ kwa nwunye ya akwụna otu nwoke adịghị ezuru," Onye akaegbe a kwuru.

Ọ gakwara n'ihu we sị na ka Nnadiogo gbuchara ụmụ ya, ọ kpọchiri onwe ya n'ime ụlọ ha wee ṅụọ nshi ọnụ gburu ya.

Onyeisi na ụlọọrụ uweojii n'Awada bụ Martin Mbajunwa kwuru na ihe a mere, na-akọwa na ha nọ na eme nyocha ugbua.

Ọ sị na egbugala ozu ndị nwụrụ na ebe ana busa ozu.

BBC Igbo gbara onye na-ekwuchịtere ndi uweojii n'Anambra bụ Nkeiruka Nwode ajụjụ maka ihe mere o wee sị na ọrịakụ Nnadiogo di mma, na ha na ya kwuru okwu taa.

Ma na asikwa na ha na eche ka emecha nchọpụta maka ihe a mere.

Gee okwu ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe uweojii Anambra kwuru maka onye gburu ụmụ ya

Ndị ụweojii na-ekwu na ọ ga abụ na Nnadiogo ṅụrụ ọgwụ ike, ma sị na ọ ndị ọlụọgwụ weta nchọpụta ha ka aga ama nke bu eziokwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara