Gọọmenti akagbuola nzukọ FEC nke izuụka a

Onyeisiala Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Buhari bụ onye isi ndị ọchịchị so na FEC

Agaghị eme nzukọ ndị ọchịchị Naịjirịa a na-akpọ 'Federal Executive Council' (FEC) nke izuụka a.

Onye na-ekwuchịtere onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina gwara ndị ntaakụkọ taa,na onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari na ọtụtụ mịnịsta ya ga- eje mmeme a ga-eme na Transcorp Hotel dị na Abuja na Wenesde bụ ụbọchị ekwesiri ime nzụkọ a.

Adesina kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụru sị,"Nzukọ FEC agaghị adị na ụbọchị Wenesde, ọnwa Febụwarị 28, nke afọ 2018."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nzukọ FEC bu ebe ndị ọchịchi na anọ ahazị ọchịchi obodo

"Ọ bụ maka na onyeisiala na ndị mịnịsta ya nwere nnukwu mmeme nke a kpọrọ 'International Conference on Lake Chad Basin,' n'ụlọ nkwari, Transcorp Hilton, dị n'Abuja.

Ha ga-anọ ogologo oge ebe ahụ."

Ndị ọchịchị gọọment a na-akpọ FEC na-agbakọ kwa Wenesde n'Abuja. Ndị na-eso na ọgbakọ a bụ ndị mịnịsta, ndị gọvanọ na ndị chibụrụ Naịjirịa dị ka onyeisiala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: