Enweghị nkewa dị na Ipob - Emma Powerful

Ọkọlọtọ IPOB Image copyright STEFAN HEUNIS
Nkenke aha onyonyo IPOB bidọ nghaghari iwe ya n'afọ 2012

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere otu chọ ka ekewapụta Biafra site na Naịjirịa akpọrọ Ipob ekwuola na akụkọ kwuru na Ipob ekewaala bụ akụkọ ashị.

N'akwụkwọ ozi Ipob zipuru ndị nta akụkọ, Powerful kwuru na onweghị onye ọbụla bụ Ezenachukwu Okwudili n'akpọ onwe ya onye isi ọhụrụ otu Ipob.

O kwukwara n'obụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche bụ kwa ndị iro ala Igbo chọ ka Ipob nwu ọnwụ n'ike.

"Ihe a chọrọ bụ ka ala Igbo na ndị otu Ipob nwe mgbagwoju anya," Powerful dere.

Ugbua BBC Igbo ka na chọ ị nweta ndị kpọrọ onwe ha otụ ohurụ nke Ipob ka ha kwuputa ọnụ nke ha.

Ihe anyi mara maka Ezenachukwu Okwudili

  • Ezenachukwu Okwudili bụ aha ọfụụ a na-kpọ maka otu Ipob.
  • Onweghị ọtụtụ ihe amara maka ya
  • Mana ozi Okwudili zịpụrụ ndị ntaakụkọ na-akọwa na Nnamdi Kanu gbahapụola ndị otu ya bụ Ipob
  • Okwudili dere na otu Ipob ọhụrụ nke ya mụpụtara ga-abụ otu na-eme emuma nke ha n'udo
  • Mana ha nyere gọọmentị Naijiria izu-uka abụọ ị tọhapụ ndị otu Ipob niile ajidere na mkpọrọ dị icheiche n'ala Naịjirịa.

Nnamdi Kanuna Ipobn'ọnụ ọgụ

Ipob bidoro n'afọ 2012, ha na-achọ ka ekewa Naịjirịa wee kenye ha mba nke ha akpọrọ Biafra.

N'ọnwa Okotoba 2015, ndị agha Naịjirịa nwụchịrị onye isi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu na Lagos.

Image copyright MARCO LONGARI
Nkenke aha onyonyo Onweghị onye mara ebe Nnamdi Kanu nọrọ ugbua

N'ọnwa April nke afọ 2017 ka ụlọikpe ukwu n'Abuja hapụrụ Nnamdị Kanu n'aka Sinetọ Alaribe n'aka mbe.

N'ọnwa Septemba afọ 2017 ndị agha bidoro ngagharị ha kpọrọ 'Egwu Eke' wee wakpo be Nnamdi Kanu n'Umuahia.

Luo ugbua, onweghị onye mara ebee Nnamdi Kanu nọrọ.

N'onwa Septemba afọ 2017, ụlọ ikpe n'Abuja kpebiri n'Ipob bụ otu na-eyi egwu.

Ugbua, onweghị ihe gọọmentị kwuru maka otu Ipob a asi pụtara ọhụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi

Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada