Ihe ise ịba jiri dị iche na Taịfọd

Onye anwụnta na-ata Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anwụnta na-ebute ọrịa ịba

Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-arịa ọrịa taifọd na-eche na ha na-arịa ịba n'ihi mgbagwoju anya dị n'ọrịa abụọ ndị a.

Ịba na Taifod bụ ọrịa abụọ a na-arịakarị na mpaghara Afrịka. Dịka WHO siri kwuo, ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 400,000 kwa afọ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka.

BBC gbara ọkachamara ahụike bụ Dkta Ikechukwu Okoroafor nke ụlọọgwụ, Mount Sinai Hospital, Lagos, ajụjụọnụ banyere ihe dị iche n'etiti ọrịa ịba na taifọd.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anwụnta bere n'ụlọmgbochi anwụnta

Njirimara ịba na taifọd

Nke a bụ ihe Dkta Ikechukwu Okoroafor kwuru maka ọrịa ọjọọ abụọ a:

  1. Nje na-enye iba bụ 'plasmodium falciparum' mana nje na-enye taifọd a na-akpọ ya 'Salmonella paratyphi'
  2. Ọ bụ anwụnta na-atanye nje na-ebute ịba n'ahụ, ebe a na-enweta Taifọd site n'iri nri fọtara afọta, nrị akwọghị aka sie ma ọ bụ mmịrị adịghị ọcha
  3. Njirimara onye na-arịa iba bụ isi-ọwụwa na ahụọkụ. Onye na-arịa taifọd na-enwekwa isi-ọwụwa na ahụọkụ. Mana a na-ejị nyocha ọbara a mara nke bụ nke
  4. Eji antimalarial were na-agwọ nje Iba ma jiri antibiotics agwọ Taifọd.
  5. Ọ bụrụ na-agwọchaghị Iba, o nwere ike bute isimgbaka, ọbara igbatu, ebe Taifọd agwọghị agwọ nwere ike bute mkpọpu eririafọ.

Gee ihe ise iba jiri dị iche na Taịfọd n'ọnụ Dr Ikechukwu Okoroafor:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ise iba jiri dị iche na taịfọd

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a