Massob: Dapchi na-egosi na Gọọmenti emeribeghị Boko Haram

Ndị nwe ụmụaka Dapchi na-efu efu Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị nwe ụmụaka Dapchi na-efu efu nọ na-atụ anya ha

Massob akatọọla ọtịtọ atọrọ ụmụakwụkwọ mmadụ otu narị na iri na ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe Steeti.

Onye na ekwuchitere Massob ọnụ ha bụ Mazị Bariara Kpalap gwara ndị BBC Igbo na ebe ọ bụ na Boko Haram nwere ike ịtọrọ ụmụakwụkwọ na-eleghị anya na-azụ, o gosiri na gọọmentị akajibeghị Boko Haram nku dị ka ha si wee kwuo.

Ọ kwara arịrị na ihe ọdachị dịka nke a nwere ike imekwa ọzọ n'ala anyị, ebe anyị ekutabeghị ume na nke meburu na Chibok, Borno steeti ihe karịrị afọ atọ gara aga.

Massob gwara gọọmentị ka ha were ọsọ ọsọ mee ihe nile ha nwere ike ime ka ụmụaka ahụ laghachite n'aka nne na nna ha.

O kwuru na ihe ga-eme ndị mmadụ enwekwa ntụkwasị obi ọzọ na ebe goomenti nọ bụ na ha na echekwaba ndụ na akụ na ụba ndị ala anyị ọfụma.

Kemgbe ụbọchị ole na ole gara aga, ndị nne na nna ụmụaka ụmụnwanyị ahụ atọrọ nọ n'akwa na iru ụjụ ma na arịọ gọọmenti ka ha kpọghachite ụmụ ha na egbughị oge.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi

Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada

Isiokwu Ndị Emetụtara