Gọọmentị agaghị akwụnwụ ụgwọ onwa ọhụrụ - NLC

Otu ndị ọrụ Naijiria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Naijirịa na-ejị May 1 eme emume mba ụwa niile ji echeta ha.

Otu na-ahụ maka ndị ọrụ n'ala Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress na-eme mmemme eji mụpụta ha n'arọ 1978.

Maka ihe a, minista na-ahụ maka ọrụ aka na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị na-akwado ị gbasa ozi gbasara ụgwọ ọnwa pekampe ọhụrụ na Naịjirịa.

N'oge gara aga, gọọmenti kwuru na ụgwọ ọnwa ọhụrụ nkea ga-abụ puku naira iri ise na isi.

Mana ndị ọrụ gọọmentị BBC kpọrọ n'elu ekwenti, ekwetaghị na gọọmentị ga-akwụ ugwọ nke a.

Gere ihe otu n'ime ha gwara anyị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ọrụ Naịjirịa

Onye ọzọ n'ime ha na chọghị ka anyị deputa aha ya gwara onye nta akụkọ anyi na onweghị steeti gọọmentị nwere udi ego ahụ ị kwụ ndị ọrụ udị ụgwọ onwa ahụ

"Ha na-ekwu na ihe a bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha nwee ike ị nweta ntụlị aka ndị mmadụ".

Onye ọrụ gọọmentị n'Imo steetị bụ Nzeocha Simeon kwuru na ya bụ ụgwọ ọnwa ọhụrụ a gaghị ezu onye ji ezinụlọ ka ya.

O na-ayo ka ego a bụrụ narị puku 100 maka ahụhụ na ọnọdụ obibi ndụ esiela ike.

Dr Achu Amadị bụ onye ọrụ gọọmenti lagoro ezumike nka kwuru na otu na-ekwuchitere ndị ọrụ na Naijirịa akpọrọ 'NLC' anaghị eme ọfụma.

Ọ sikwa na ha kwesiri ịhụ na ya bụ nkwa gọmmentị kwere maka ụgwọ ọnwa ọhụrụ bụ ihe biara na mmezu.

Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ṅomie ndị ibe ha nọ na mba ọzọ n'ụzọ ziri ezi.

Isiokwu Ndị Emetụtara