Umahi amachiela ndị ọchị ehi ịbata Ebonyi Steeti

Onye Fulani na ehi ya Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị a na-ekwu na-akpa ike dị icheiche

Onye na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi amachiela ndị ọchị ehi na ehi ha isi steeti ọzọ bata Ebonyi nakwa ịkpa nri n'abalị.

Mmachi a sitere n'ọgụ ndị Akaeze bụ obodo dị na steetị ahụ, na ndị ọchị ehi lụrụ.

Gọvanọ Umahi sị na nanị ihe ga-eme ka anabata ndị ọchị ehi n'Ebonyi bụ ma ọ bụrụ na ha wetere ikike n'ebe ha si na ndị na-achị obodo ha na-aga.

Umahi kwuru okwu ndị a ka ya na ndị Fulani na-achị ehi nwere nzukọ n'ụlọ gọọmenti n'Abakaliki.

Ndị ọchị ehi na ndị ọkọugbo n'Akaeze nwere ọgbaghara n'ugbo, mana mgbe ajụrụ ha ajụjụ ha abụọ sị n'aka ha dị ọcha.

Onye na-ekwuchitere ndị Fulani n'Ebonyi bụ Yusuf Sambo sị na mmadụ abụọ n'ime ha merụrụ ahụ ma nọkwara n'ụlọ ọgwụ n'Agwu nke dị n'Enugu Steeti ugbua.

Onye na-ekwuchitere ndị Akaeze bụ Onyebuchi Ogbadu sị na nwafọ ha bụ Daniel Ngwoke merụkwara ahụ ma nọrọ n'ụlọọgwụ Federal Teaching Hospital nke dị n'Abakaliki.

Maka etu okwu a siri dị, gọvanọ Ebonyi Steeti sị na ya ahaziela otu mmadụ atọ ga-agba izu, mee nchọpụta ma hụ na ndị aka ha adịghị ọcha na ihe a mere ga-ata ahụhụ.

"Ndị uweojii, ndị nchekwa obodo, ndị agha na ndị ihe a metụtara ga-eweta mmadụ abụọ ga-eme otu nchọpụta mmadụ 19, mana m ga-amachi ndị ọchị ehi ibanye Ivo mgbe a na-eme nchọpụta a," Gọvanọ Umahi kwuru.

Gọvanọ Umahi gakwara n'iru ikwe nkwa na emechaa nchọpụta, ya ga-agba mbọ hụ na "onye malitere nsogbu a ga-aga mkpọrọ".

Esemokwu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọkọugbo n'ebe dị icheiche na Naịjirịa. Esemokwu a ebutela ogbugbu ọtụtụ mmadụ na mmebi akụnụba.

Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ndị agha na ndị uweojii ka ha ga mee nchekwa na Benue Steeti nakwa ebe ndị ọzọ nsogbu na-akpọtụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara