WHO: Naijịrịa nwere nwakpo Lassa fever kachasị nụ

Rats Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Oke na-ebutekarị ọrịa 'Lassa fever'

Mwakpo 'Lassa fever' eruola ogogo o na-erubeghị na mbụ ebe ụlọ nyocha ahụ nke a nakpọ Laboratory chọpụtara ọnọdụ 'Lassa fever' ruru nari atọ,iri na asaa.

Ọ bụ site na ọnụọgụ nke ngalaba na-ahụ maka igbochi ọrịa na Naijiria bụ 'Nigeria centre for disease control' weputara ka eji chọpụta nke a.

Ọ bụ eziokwu na ya bụ ọrịa na-awakpo karị ndị West Afirịka,mana ọ rutubeghị otu a na Naijịria.

Ọnụ ọgụ ọnọdụ Lassa fever na ọnwa abụọ garaga karịrị ọnụ ọgụ ọnọdụ a chọpụtara na arọ 2017.

Nwakpo a e metutala steeti iri asatọ ka mgbe a chọpụtara ọnọdụ nke mbụ n'ụbọchị mbu n'arọ January 2018, nke kpatara ọnwụ mmadụ iri asaa na abụọ.

Ihe ruru mmadụ puku abụọ ,narị asatọ,irị anọ na ise ndị biaketere ndị nwere 'lassa fever' bụcha ndị a na-enyocha kita.

Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ahụike na mba ụwa niile akpọrọ 'World Health Organisation' na-akwado NCDC na inweta njikọ na ọgwugwọ, nyocha, ichọpụta,ọzụzụ ndị ọrụ na-ahụ maka ahụ ike makwa i lekọta ndị ime obodo .

Dọkita Wondimagegnehu Alemu bụ onụ na-ekwuchitere WHO ọnụ na Naijịrịa kwuru na ikike iji wee chọpụta ọsisọ ọnọdụ nwakpo ọrịa n'etịtị ndị ime obodo ma gwọ ha ọsisọ dị ha mkpa.

Lotanụ na nime ndị Lassa fever gbugoro bụ ndị ọrụ ụlọgwu ruru iri na anọ.