Ngwa ahịa agbaala ọkụ n'Alaba International

Ahịa Alaba Image copyright Chinedu
Nkenke aha onyonyo Ọkụ a gbara ulọ ngwa ahịa anọ n'Alaba International

Ọkụ agbaala ụlọ ngwa ahịa anọ akpọrọ warehouse n'olu bekee n'Alaba International.

Onye hụrụ n'anya nọ mgbe ihe mberede a mere akpọrọ Chinedu kwuru na ọkụ a bidoro n'elekere anọ nke mgbede a.

Ọ sị na tupu ụlọ ọru na-ahụ maka mmenyụ ọkụ abiaghị n'oge.

Ọ sị na n'ime ụgbọ ha atọ biara imenyụ ọkụ ahụ, otu ebughị mmiri.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Image copyright Chinedu
Nkenke aha onyonyo Ọkụ a gbara ulọ ngwa ahịa anọ n'Alaba International

Chinedu kwuru na onweghị onye meruru ahụ maọbụ onye ọkụ gbagburu karia ma ọtụtụ ngwa ahia gbaara ọkụ.

Ọ sị na oruru ihe karịrị 'container 40 feet' iri n'ime ụlọ ngwa ahịa ahụ.

Chinedu gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị China nwee ya bụ ụlọ ngwa ahịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara