Rwanda: Anyị emechiela ụlọụka 700 maka 'mkpọtụ'

Ndị nọ n'ụlọụka Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị nọ n'ụlọụka ekpe ekpere

Ndị mba Rwanda mechiri ụlọụka ruru narị asaa maka na 'arụsighị ebe ha jiri mere ụlọụka ha ike nakwa na ha na-eme oke mkpọtụ ma ha na-aka ụka'.

Ụfọdụ n'ime ha bụ ụka pentikọstal, kama e mechikwara otu ụlọalakụba.

Otu onye ọrụ ọchịchị gwara BBC na-emepegharịrị ụfọdụ n'ime ụlọụka 700 ahụ ka ndị nyocha kwadochara ya.

E tinyekwara iwu ọhụrụ kwuru na ndị mgbasa oziọma niile ga-enweta ọzụzụ mmụta okpukpe tupu ha emepee ụlọụka.

Ụfọdụ ụka pentikọstal nke ndị mgbasa oziọma ha na-arụ 'ọrụ ebube', mụbanyere nke ukwuu na mpaghara Afrịka n'ime afọ ole na ole gara aga.

Ebe ụfọdụ ụka nwere ọtụtụ ndị ofufe na-arụ ụlọ dị mma, ụfọdụ ndị nke pere mpe na-arụ ụlọ mkpọmkpọ n'anataghị ikike.

Ụfọdụ oge, a na-akpụrụ ụlọụka ndị a n'ọnụ maka iji igwe okwu na-eme ka okwu dapụta ụda achọta ndị ofufe ọhụrụ.

Justus Kangwagye bụ onye ọrụ ọchịchị gwara BBC na ihe ha chọrọ bụ ka ụlọụka ndịa mee ihe ndị kwesịrị ekwesị.

Kangwagye gwara ndị ntaakụkọ New Times dị na Rwanda n'ụfọdụ ụlọụka ahụ na-etinye ndị otu ha na nsogbu n'ekwesịghị ekwesị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara