Hope Hicks etinyela akwụkwọ arụkwaghịm

Hope Hicks Image copyright AFP/GETTY IMAGES
Nkenke aha onyonyo Hope Hicks sị na ọ teela ọrụwara Trump ọrụ

Hope Hicks, ezigbo onye ndụmọdụ onyeisi ala Amerika bụ Donald Trump ga-aritu n'ọkwa ya dika onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ụlọ ọcha.

Ekwupụtara nke a ka o kwụputechara ọtụtụ ihe n'ịhụ kọmịtị nke ndị amamihe, mana ndị otu ụlọ ọcha akpọrọ 'White house' na ọ bụghị ya kpatara ya.

Nwata Nwagbọghọ Hicks dị arọ iri abụọ na itoolu gwara ndị otu ya na ọ napụ maka na ọ mezuchala ihe niile ọchọrọ ime na ọchịchị Trump.

Ọ sị na oteela aka ọrụwara Trump ọrụ.

Ọ bụ onye nke anọ na ndị rụgoro ọrụ mgbasa ozi a n'ọchịchị Trump.

Ụbọchị Tuesday gara aga, Hicks kwuputara n'ihu otu na-enyocha nsonye aka Russia na mbinye aka ichọ onyeisi ala Amerika mere na 2016.

Akụkọ kwuru na Hicks kwetere na ọ na tụ asị ọcha mgbe mgbe n'isi Trump mana ọgọrọ na ọ tụghị asi gbasara ihe ọbụla pụtara na nyocha ahụ.

Onye na-ekwuchitere ụlọ ọcha akpọrọ Sarah Sanders, kọwara Hicks dika onye na-anọrọ onwe ya kwuru na odobeghị anya mgbe ọ ga-apụ kpakpam n'ọchịchị Trump.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Trump banyere n'ọchịchị n'arọ 2016

Lee ndị ọzọ pugoro n'ọchịchị Trump?

  • Michael Flynn: Onye ndụmọdụ na nchekwa obodo (O tinyere akwụkwọ)
  • Sean Spicer: Onye Mgbasa ozi (O tinyere akwụkwọ)
  • Steve Bannon: Ọkachasị n'iwepụta atụmatụ (O tinyere akwụkwọ)
  • Dr.Tom Price: Ode akwụkwọ gbasara ahụike (O tinyere akwụkwọ)
  • Reince Priebus: Onye na-elekọta ndị ọrụ (O tinyere akwụkwọ)
  • Katie Walsh: Osote onye na-elekọta ndị ọrụ (O tinyere akwụkwọ)
  • Michael Short: Onye mgbasa ozi (O tinyere akwụkwọ)
  • Sebastian Gorka: Osote onye na-enyere onyeisi ala aka (O tinyere akwụkwọ)
  • Michael Dubke:Onyeisi ndị mgbasa ozi (O tinyere akwụkwọ)
  • Anthony Scaramucci: Onyeisi ndị mgbasa ozi (O tinyere akwụkwọ)
  • Walter Shaub: Onyeisi na-ahụ maka akparamagwa (O tinyere akwụkwọ)
  • James Comey:Onyeisi FBI (Achụrụ ya n'ọrụ)
  • Preet Bharara: Ọkaipe ukwu (Achụrụ ya n'ọrụ)
  • Derek Harvey: (Achụrụ ya n'ọrụ)
  • Andrew McCabe: Osote Onyeisi FBI (O tinyere akwụkwọ)
  • Dr.Brenda Fitzgerald: Onyeisi ụlọ ọrụ na-ahu maka i gbochi ọrịa (O tinyere akwụkwọ)
  • Rob Porter: Onye ode akwụkwọ ụlọ ọcha (O tinyere akwụkwọ)
  • Hope Hicks: Dairektọ Mgbasa ozi ụlọ ọcha (O tinyere akwụkwọ)

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a