Nwa Ben Enwonwu: Anyị agaghị eketa n'ime ego 'Tutu'

Oliver Enwonwu Image copyright Oliver Enwonwu
Nkenke aha onyonyo Oliver Enwonwu, ọkpara Ben Enwonwu bụ onye nka ihe eserese dịka nna ya

Ọkpara Ben Enwonwu bụ Oliver Enwonwu ekwuola na onweghị ihe ezinaụlọ ha ga-eketa na agidimgba ego eretara na nka nna ya nke e rere na London na nsonso a.

Abalị atọ gara aga, e reela nka Ben Enwonwu sere n'afọ 1974 nke ọ kpọrọ 'Tutu,' otu ijeri dọla nke pụtara nde narị ise na asatọ.

N'ajụjụọnụ onye ntaakụkọ BBC gbara ya n'ekwenti, Enwonwu kwuru na " Ọ bụ ihe mwute na ezinalụlọ ya agagị eketa ihe ọbụla na'egọ ahụ. Ugbua onweghị iwu kwadoro ka ndị nka Naijiria na-enweta ihe nketa ọrụ nka ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị nka Naijiria na-agba mbọ ha na ndị ogbo ha ndị mba ojikọ iji hụ na ndị nka ga na-enweta pacent n'ime ihe ere nka dị ka ntị na-eti egwụ ndị nwere ohere irite ihe na nka afọ iri asaa.

Ọ kọwakwara na ọgịga ya na London ebe a nọ re ihe nka ahụ bụ maka nkwanye ukwu e nyere nna ya na ọrụ ya.

Gee ihe ọkpara Ben Enwonwu kwuru na bekee:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Anyị agaghị eketa na ego nka Ben Enwonwu'

Cheta na Ben Enwonwu nwụrụ anwụ bụ onye nka eserese a ma ama.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Goldsmiths, Ruskin College, Oxford na Slade art School London na 1940. Tupu Ben Enwonwu a laa mụọ na 1994, ọ bụ ya ka enyere ọrụ ịkpụ Queen Elizabeth mgbe ọ biara Naịjirịa n'afọ 1956.

Image copyright Oliver Enwonwu
Nkenke aha onyonyo Ben Enwonwu sere 'Tutu' atọ

Akụkọ ndị ọzọ na-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara