Dapchi: A chọtala ụmụakwụkwọ atọro na Yobe Steeti?

Ndị Agha Naijirịa Image copyright @NigAirForce
Nkenke aha onyonyo A tọrọ ụmụakwụkwọ 110 a n'ọnwa Februwarị

Taa mere ụbọchị nke iri otu na otu (11) a tọrọ ụmụakwụkwọ na-agụ akwukwọ na Girls Government Girls Science and Technical College (GGSTC) ,Dapchi, Yobe steeti ruru notu nari na iri.

Akwụkwọ ozi ndị isi ọchịchị Naijiria depụtara na-ekwu na ha ga-ebido chọwa ha n'obodo ndị agbataobi Naijiria.

Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na omenaala nke gọọmenti Naijiria bụ Lai Mohammed depụtara akwụkwọ ozi a.

N'ime ya,o kwuru na ndị isi ndị agha akwarala gawa Ugwu Awụsa ka were kwado mbọ ịchọ ụmụ aka ahụ na-efu efu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ndị sonyere na njem a bụ ndị agha Naijiria gbalitere n'ọkwa.

Ha gụnyere Gen. Abayomi Olonisakin,Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas; Chief of Army Staff; Lt.-Gen.Tukur,Buratai na Alhaji Lawal Daura.

Ha sonyere onyeisi ndị agha ụgbọelụ bụ Air Marshal Sadique Abubakar,onye nke kwagarala Ugwu Hausa.

Na mbu, gọọmentị etiti na nke Yobe steeti na-agọ na onweghị ụmụaka na-efu ebe ha kwuru na ha achọtala ha. O bụ mgbe ndị nwe ụmụ aka ndị bidoro tiwe mkpu na-ha ahụ beghị ụmụ ha magbakọ dekọta aha mmadụ nari ise ka gọọmentị kwetara na mmadụ otu narị na iiri na-efu kemgbe ndị Boko Haramwakporo ụlọ akwụkwọ ha n'onwa Februwarị iri na itoolu.

E wepụtakwara kọmiti ga-enyocha ihe niile gbasara ntọ ụmụaka ahụ.