Ndị ntọ atọrọla otu onye ntaakụko n'Ụmụahịa

Ndị uweoji Naịjiria Image copyright Getty/AFP

Otu onye ode akụkọ bụ kwa onye nkwusa n'alagalaba mgbasa ozi akpọrọ Abacityblog.com bụ Ngozi Blessed Onwukwe ka akụkọ kwuru na ndị ntọ tọọrọ ya n'Ụmuahia.

Anya hụrụ ka o siri mee kwuru na ọ bụ ụmụnwoke anọ bu ụgbọala Toyota Sienna tọọrọ ya n'ogologo ụzọ Ikot Ekpene dị n'Umuahia.

O kwuru na nke a mere mgbe ọ na-achọ ị ga mmemme n'obodo Arọchukwu.

O kwuru na Ngozi guzo n'akụkụ ụzọ ebe ọ na-eche ụgbọala, mgbe ụgbọala ahụ nọchiri ya ihu, ndị nwoke abụọ gbara dimkpa pụtara ma dọbaya ya n'ime ụgbọala ahụ.

Akụkọ kwuru na o yi uwe edere ABACITYBLOG mgbe ha tọrọ ya.

Mbọ niile agbara iji nweta ya n'ekwe ntị, mara afọ n'ala.

Ndị tọrọ ya e mebeghi ka ndị ezinaụlọ ya na ọ bụ aka ha dịna ya.

Ndị otu na-ahụ maka mgbasa ozi na ịntaneti ngalaga Abịa Steeti katọrọ ntọrọ Onwukwe.

Ha kwuru ka ndị ọrụ nchekewa nke Steeti Abia gbalia gbapụta onye ntaakụkọ ahụ.

Ụfọdụ ndị ntaaụkọ nọ n'Umuahia ndị BBC gbara ajụjụọnụ kwuru na ha anụbeghi ihe gbasara nke a.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweoji n'Umuahia bụ Janet Egwu Chukwu gwara ndị BBC na ekwenti na ọ maghị gbasara ihe nke a mere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara