Ndị uweojii anwụchiela ọkaiwu adigboroja

Ndị uweojii Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa

Ndị uweojii n'Imo Steeti anwụchiela otu nwaanyi aha ya bụ Beatrice Nnamuoh ha sịrị na-arụ ọrụ dịka ọkaiwu na-erughieru kamgbe afọ ise.

Beatrice gụrụ ihe a na-akpọ 'Sociology' na mahadum mana ọ nọ na-arụ ọrụ dịka ọkaiwu ma na-enweta ọtụtụ mmeri.

Nnamuoh, dị afọ 35, bụ onye Iyiawa dị n'Anambra steeti, mana ya na di ya na ụmụ ha anọ bi n'Okporo, nke dị na Ọrlụ n'Imo steeti.

Ndị uweojii si na ha nwetere uwe ndị ọkaiwu dị icheiche na akwụkwọ ebiri aha ụlọọrụ ọkaiwu n'ụlọ ebe Nnamuoh bi.

Nnamuoh gwara ndị ntaakụkọ Punch gbara ya ajụjụ na ya mere ihe a nke a sịrị na o mere.

"Agbanyeghị na m gụrụ Sociology, mụ na ndị ọkaiwu na-arụkọ, ya mere m jiri mụta ihe gbasara iwu. E nwekwara m ụbụrụ. Ya mere, ihe ọ bụla m mere, a na m eme ya nkeọma," Nnamuoh gwara ndị ntaakụkọ.

"A hụrụ m ọrụ ọkaiwu na anya. A chọrọ m i nweta ohere gụọ ya na mahadum ugboro anọ, n'ihi ego, emeghi m ya. Ọ bụ maka i nyere onwe m aka mere m jiri tinye aka na nrụrụaka a."

Nnamuoh na-arịọ mgbaghara, kwuo na ochegharịala.

Mana onyeisi ndị uweojii n'Ime Steeti bụ Chris Ezike kwuru n'aka kpara Nnamuoh n'Orlu mgbe ọghọrọ ndị mmadụ aghụghọ wee napụ ha ego rụrụ naịra 342,000.

"Ọ napụrụ ndị mmadụ ego ka ọ tụrụ ha asị ma reesi ha ụgbọala, ebe ọ gwakwara ha na ọ bụ onye ọkaiwu." Ezike kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara