Ebugharịala ikpe Eni na Shell nwere n'Italy maka Naịjirịa

Eni na Shell Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-akọwa na nke a nwere ike ịbụ ikpe mpụ na nrụrụaka dị n'etiti ndị mmanụ agbịdị a ga-akacha ekwu maka ya

Kama Eni na Shell ga-azara ọnụ ha gbasara ebubo eboro ha maka inye akaazụ na nrụrụaka maka ala mmanụ agbịdị ha zụrụ na Naịjirịa taa n'ụlọikpe dị na Milan, Italy, ebugharịala ụbọchị mgbaraonwe ha.

Otu onye ọkaikpe na Milan kwuru na-ebugala ikpe ha ụbọchị 14 nke ọnwa Mee maka na ha nwere ọtụtụ ikpe ha ga-ekpe, nke mere na a ga-ebuga ya ụlọikpe ọzọ dịkwa na Milan iji kwụsị igbu ya oge ọzọ.

Onyeisi ndị Eni bụ Claudio Descalzi na Paolo Scaroni bụ onye ọ nọchiri anya ya na ndị ọrụ si Eni na Shell, so na ndị ga-azara ọnụ ha n'ihu okaiwu.

Dan Etete bụbụ minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa ga-esokwa zara ọnụ ya.

Eni - ndị ebokwara ebubo nrụrụaka na mba Algeria - na Shell ga-agba mbọ ịgbara isi onwe ha ka-ebochara ha ebubo inye akaazụ oge ha zụrụ ala mmanụ agbịdị akpọrọ OPL245 na 20111, nke a na-ele anya n'onwere udu mmanụ agbịdị ijeri itoolu, ka ha kwụchara dọla otu ijeri na nde narị atọ ji zụta.

Otu abụọ a agọrọla aka ha n'ime ebubo ndị a eboro ha.

"Obi kara Eni n'ime ngalaba ikpe marakwa n'ikpe a ga-ezi ezi ma gosikwa eziokwu na iguzosi ike n'ezi ihe gbasara omume ha," ka Eni kwuru n'ihe ndepụta ha wepụtara.

Akụkọ si n'aka ndị Global Witness bụ mpaghara na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka, kwuru na nkwekọrịta dị n'etiti ndị otu a na onyeisiala chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan na Etete bụbụ minista ya, gosiri na ha nara akaazụ.

Eni kwuru sị: "Eni na Shell na gọọmentị etiti mere nkwekọrịta ha n'akpọghị onyeọzọ aha. Etinyere ego ha natara n'ime otu akpa gọọmentị etiti Naịjirịa nwere,"

Ikpe a na-ekwu maka ya

Descalzi kwuru n'afọ gara aga na Shell na Eni etinyeghị ọnụ "n'ime etu gọọmentị si kpebie ike ego ahụ."

Shell kwuru na ha kwere na ndị ọkaikpe ga-ekwubi n'onweghị ikpe ga-emedgide ha, kwuokwa "inye akaazụ na nrụrụaka enweghị ohere n'otu anyị".

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Naịja Delta bụ ebe a na-emepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa

Mmekọrịta Shell na gọomentị Naịjirịa nwere na 2011 kwesịrị ịkwụsị ikpe ọgụ afọ ha na Malabu bụ otu mmanụ agbịdị nke Dan Etete nwere gbasara ala mmanụ OPL245.

Etete wụbụ minista oge Sani Abacha chịrị, kwadoro ala mmanụ ahụ n'afọ 1998, ma resị ya Malabu bụ otu emechara chọpụta na ọ bụ ya nwe.

Gọọmentị mechara napụ ya ikike gosiri na ọ bụ ya nwe ya, nye ya Shell ma nyeghachịkwa ya Malabu, nke mere e ji gbaa ha akwụkwọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara